Abụ Ọma 67:1-7

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke ụbọ akwara. Abụ olu ụtọ, abụ. 67  Chineke ga-emere anyị amara wee gọzie anyị;+Ọ ga-eme ka anyị nweta ihu ọma ya+Sila   Ka e wee mara ụzọ gị n’ụwa,+Marakwa nzọpụta gị n’etiti mba niile.+   Ka ndị dị iche iche too gị, Chineke;+Ka ndị dị iche iche, ha niile, too gị.+   Ka mba dị iche iche ṅụrịa ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ,+N’ihi na ị ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe ziri ezi;+Ị ga na-edukwa mba dị iche iche n’elu ụwa. Sila.   Ka ndị dị iche iche too gị, Chineke;+Ka ndị dị iche iche, ha niile, too gị.+   Ala ga-emepụta ihe nke ọma;+Chineke bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.+   Chineke ga-agọzi anyị,+Nsọtụ niile nke ụwa ga-atụkwa egwu ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji