Abụ Ọma 66:1-20

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ, abụ olu ụtọ. 66  Tikuonụ Chineke mkpu mmeri, unu niile ndị bi n’ụwa.+   Bụọnụ abụ olu ụtọ iji too aha ya.+Nyenụ ya otuto dị ebube.+   Sịnụ Chineke: “Lee ka ọrụ gị niile si dị egwu!+Ndị iro gị ga-eji egwu bịakwute gị n’ihi ịdị ukwuu nke ike gị.+   Ndị niile bi n’ụwa ga-akpọrọ gị isiala,+Ha ga-abụkukwa gị abụ olu ụtọ, ha ga-abụku aha gị abụ olu ụtọ.”+ Sila.   Bịanụ hụrụ ọrụ dị iche iche nke Chineke.+Otú o si emeso ụmụ mmadụ dị egwu.+   O mere ka oké osimiri ghọọ ala akọrọ;+Ha wee jiri ụkwụ si n’etiti osimiri gafere.Anyị malitere ịṅụrị ọṅụ n’ime ya n’ebe ahụ.+   O ji ike ya na-achị achị ruo mgbe ebighị ebi.+Anya ya dị n’ebe mba niile nọ.+Ka ndị isi ike ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila.   Gọzienụ Chineke anyị, unu ndị dị iche iche,+Meekwanụ ka a nụ olu otuto a na-enye ya.+   Ọ na-edebe mkpụrụ obi anyị n’etiti ndị dị ndụ,+O kweghịkwa ka ụkwụ anyị maa jijiji.+ 10  N’ihi na i nyochawo anyị, Chineke;+Ị nụchawo anyị dị ka e si anụcha ọlaọcha.+ 11  I mewo ka anyị banye n’ụgbụ e ji achụ nta;+I mewo ka nsogbu na-anyịji anyị úkwù. 12  I mewo ka ịnyịnya mmadụ efu wụfee anyị n’isi;+Anyị agabigawo ọkụ na mmiri,+I wee kpọpụta anyị mee ka anyị nwere onwe anyị.+ 13  M ga-eji àjà a na-esurecha n’ọkụ bata n’ime ụlọ gị;+M ga-emezu nkwa m kwere gị,+ 14  Nke m meghere egbugbere ọnụ m kwupụta,+Nke ọnụ m kwupụtara mgbe m nọ n’oké ihe isi ike.+ 15  M ga-eji anụ mara abụba chụọrọ gị àjà a na-esurecha n’ọkụ,+Jirikwa ebule chụọrọ gị àjà.M ga-achụ oké ehi na mkpi n’àjà.+ Sila. 16  Bịanụ gee ntị, unu niile ndị na-atụ egwu Chineke, m ga-akọ+Ihe o mewooro mkpụrụ obi m.+ 17  M ji ọnụ m kpọkuo ya,+M jikwa ire m too ya.+ 18  Ọ bụrụ na m na-eche ihe ọjọọ n’obi m,Jehova agaghị anụ olu m.+ 19  N’ezie, Chineke anụwo;+Ọ ṅawokwa ntị n’ekpere m.+ 20  Ka Chineke bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-elegharaghị ekpere m anya,O wepụghịkwa obiọma* ya n’ebe m nọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”