Abụ Ọma 65:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. Abụ. 65  Chineke, ọ bụ gị nwe otuto na ịgba nkịtị n’ime Zayọn;+A ga-emezukwa nkwa e kwere gị.+   Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.+   Njehie m dị ọtụtụ nke na agaghị m ebuli ya.+Ma gị onwe gị ga-ekpuchi mmebi iwu anyị.+   Obi ụtọ na-adịrị onye ị họọrọ, nke i mekwara ka ọ bịaruo nso,+Ka o wee biri n’ogige gị.+Ihe ọma nke dị n’ụlọ gị,+Bụ́ ebe nsọ nke ụlọ nsọ gị,+ ga-eme ka afọ ju anyị.   Chineke nke nzọpụta anyị,+Biko, jiri ihe dị egwu i mere n’ezi omume za anyị,+Gị Onye ndị niile bi na nsọtụ ụwa nakwa ndị nọ n’ebe dị anya n’elu oké osimiri tụkwasịrị obi.+   O ji ike ya na-eme ka ugwu guzosie ike;+O kere ike n’úkwù ya.+   Ọ na-eme ka mkpọtụ nke oké osimiri dajụọ,+Ọ na-emekwa ka mkpọtụ nke ebili mmiri ya nakwa ọgba aghara nke mba dị iche iche dajụọ.+   Ndị bi na nsọtụ ụwa ga-atụ ihe ịrịba ama gị niile egwu;+Ị na-eme ka chi ọbụbọ na chi ojiji tie mkpu ọṅụ.+   I chewo ihu gị n’ebe ụwa dị, ka i wee mee ka ihe jupụta na ya;+Ị na-eme ka ihe jupụta n’ime ya.Iyi nke si n’aka Chineke jupụtara na mmiri.+Ị na-eme ka ala mepụta nri,+N’ihi na ọ bụ otú ahụ ka i si akwadebe ala.+ 10  E mewo ka mmiri dee ebe a kọrọ akọ na ya, kposaakwa ájá ya ndị kpụkọrọ akpụkọ;+Ị na-eji mmiri na-ezosi ike mee ka ọ dị nro; ị na-agọzi ihe puru na ya.+ 11  I jiriwo ịdị mma gị kpuwe afọ okpueze,+Abụba na-atasị n’ụzọ gị.+ 12  Mmiri edewo ala ịta ahịhịa nke dị n’ala ịkpa,+Ugwu nta dị iche iche ekewokwa ọṅụ n’úkwù ha.+ 13  Ebe ịta nri ejupụtawo n’ìgwè ewu na atụrụ,+Nri ekpuchiwokwa ndagwurugwu dị iche iche.+Ha na-eti mkpu mmeri, ee, ha na-abụ abụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji