Abụ Ọma 64:1-10

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 64  Chineke, biko, nụrụ olu m n’ime nchegbu m.+Chebe ndụ m ka m ghara ịtụ onye iro ụjọ.+   Zobe m ka okwu nzuzo nke ndị na-eme ihe ọjọọ ghara irute n’ebe m nọ,+Tinyere oké aghara nke ndị na-eme ihe ọjọọ,+   Ndị mụworo ire ha amụ dị ka mma agha,+Ndị tụdoworo mmadụ akụ́ ha, bụ́ okwu ọjọọ,+   Iji nọrọ n’ebe zoro ezo gbaa ya onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+Na mberede, ha na-agba ya ụta ahụ, ha adịghị atụ egwu.+   Ha na-ekwu okwu ọjọọ mgbe niile;+Ha na-ekwu okwu isi ọnyà ma zoo ha.+Ha asịwo: “Ònye ga-ahụ ha?”+   Ha na-echepụta ihe ọjọọ;+Ha ezobewo atụmatụ aghụghọ ha ji akọ chepụta,+Ihe dị n’ime onye nke ọ bụla, ya bụ, n’ime obi ya, dị omimi.+   Ma Chineke ga-agba ha akụ́ na mberede.+O merụwo ha ahụ́,+   Ha na-emekwa ka mmadụ sụọ ngọngọ.+Ma ire ha na-ekwu okwu megide ha.+Ndị niile na-ele ha anya ga-efufe isi,+   Egwu ga-ejide mmadụ niile;+Ha ga-akọ akụkọ ihe Chineke mere,+Ha ga-aghọtakwa ọrụ ya.+ 10  Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, gbabakwa n’ime ya;+Ndị niile obi ha ziri ezi ga na-anyakwa isi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji