Abụ Ọma 62:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn. Abụ olu ụtọ Devid. 62  N’ezie, ọ bụ Chineke ka mkpụrụ obi m gbara nkịtị na-echere.+ Nzọpụta m na-esi n’aka ya.+   N’ezie, ọ bụ oké nkume m na nzọpụta m, ebe m dị elu e wusiri ike;+A gaghị eme ka m maa jijiji nke ukwuu.+   Ruo ole mgbe ka unu ga na-awakpo onye unu ga-egbu?+Unu niile yiri mgbidi chọrọ ịda ada, mgbidi e ji nkume wuo nke a na-akwa aka ka ọ daa.+   N’ezie, ha na-enye mmadụ ndụmọdụ iji rafuo ya ka ọ ghara inwekwa ùgwù;+Okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.+Ha na-eji ọnụ agọzi mmadụ, ma na-akọcha ya n’ime obi ha.+ Sila.   Mkpụrụ obi m, gbachie nkịtị chere Chineke,+N’ihi na olileanya m na-esi n’aka ya.+   N’ezie, ọ bụ oké nkume m na nzọpụta m, ebe m dị elu e wusiri ike;+A gaghị eme ka m maa jijiji.+   Nzọpụta m na ùgwù m dị n’aka Chineke.+Chineke bụ oké nkume m siri ike na ebe mgbaba m.+   Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile.+Wụpụnụ obi unu n’ihu ya dị ka mmiri.+Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.+ Sila.   Ụmụ mmadụ bụ n’ezie ume e kupụrụ ekupụ,+Ụmụ mmadụ bụ ebe mgbaba a na-apụghị ịtụkwasị obi.+Ọ bụrụ na a tụọ ha atụ̀, ha niile dị fere fere karịa ume e kupụrụ ekupụ.+ 10  Unu atụkwasịla obi n’irigbu mmadụ,+Unu atụkwasịkwala obi na-enweghị isi n’ịpụnara mmadụ ihe.+Ọ bụrụ na akụ̀ adị ukwuu, unu etinyela obi unu na ya.+ 11  Otu ugboro ka Chineke kwuru okwu, ugboro abụọ ka m nụrụ ya,+Na ọ bụ Chineke nwe ike.+ 12  Jehova, ọ bụ gị nwe obiọma,*+N’ihi na gị onwe gị na-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”