Abụ Ọma 61:1-8
Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Abụ ọma Devid.
61 Chineke, biko, nụrụ ákwá m na-ebesara gị.+Ṅaa ntị n’ekpere m.+
2 M ga-esi na nsọtụ ụwa tikuo gị, mgbe obi m dara mbà.+Duru m ka m rịgoro n’elu oké nkume nke dị elu karịa m.+
3 N’ihi na ị bụụrụ m ebe mgbaba,+Bụkwaara m ụlọ elu siri ike n’ihu onye iro.+
4 M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi;+M ga-agbaba n’okpuru nku gị.+ Sila.
5 N’ihi na gị onwe gị, Chineke, egewo ntị ná nkwa m kwere.+I nyewo m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị.+
6 Ị ga-eme ka ụbọchị eze dịkwuo ogologo;+Ọ ga-adị ogologo ndụ dị ka à ga-asị na ọ bụ site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
7 Ọ ga-ebi n’ihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;+Biko, zite obiọma* na eziokwu, ka ha wee chebe ya.+
8 N’ihi ya m ga na-abụku aha gị abụ olu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi,+Ka m wee na-emezu nkwa m kwa ụbọchị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”