Abụ Ọma 60:1-12
Ntụziaka e nyere onye nduzi Okooko Lili nke Ihe Ncheta. Miktam. Abụ ọma Devid. Maka ịkụzi ihe.+ Mgbe ya na Eram-nehareyim na Eram-Zoba lụrụ ọgụ, Joab wee laghachi gbuo ndị Idọm dị puku mmadụ iri na abụọ na Ndagwurugwu Nnu.+
60 Chineke, ị jụwo anyị, ị wakpowo anyị,+I wewo iwe. Nabataghachi anyị.+
2 I mewo ka ala maa jijiji, i mewo ka ọ gbawaa.+Mechie oghere ya niile, n’ihi na ọ mawo jijiji.+
3 I mewo ka ndị gị nwee ihe isi ike.+I mewo ka anyị ṅụọ mmanya, anyị wee na-adagharị.+
4 I nyewo ndị na-atụ egwu gị ihe mgbaàmà+Ka ha na-agba rịgọ rịgọ ka a ghara ịgbata ha ụta. Sila.
5 Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya,+Biko, jiri aka nri gị zọpụta anyị ma za anyị.+
6 Chineke ekwuwo okwu n’ịdị nsọ ya, sị:+“M ga-aṅụrị ọṅụ, m ga-ewere Shikem nye ndị m ka ọ bụrụ ihe nketa ha;+M ga-atụkwa ndagwurugwu Sọkọt atụ̀ nyefee ndị m.
7 Ọ bụ m nwe Gilied, ọ bụkwa m nwe Manase,+Ifrem bụkwa ebe e wusiri ike nke onye m mere onyeisi;Juda bụ mkpara nke onye m mere onye na-achị achị.+
8 Moab bụ ite m ji asa ihe.+M ga-atụba akpụkpọ ụkwụ m n’Idọm.+M ga-eti mkpu mmeri n’isi Filistia.”+
9 Ònye ga-akpọga m n’obodo ahụ a nọchibidoro n’agha?+Ònye ga-eduru m ruo Idọm?+
10 Ọ́ bụghị gị, Chineke, bụ́ onye jụrụ anyị,+Onye na-adịghịkwa eso ndị agha anyị eje agha dị ka Chineke?+
11 Nyere anyị aka ka anyị pụta n’ahụhụ,+N’ihi na nzọpụta nke si n’aka mmadụ abaghị uru.+
12 Anyị ga-enweta ike site n’enyemaka Chineke,+Ya onwe ya ga-azọdakwa ndị na-emegide anyị.+