Abụ Ọma 57:1-11

Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ ọma Devid. Miktam. Mgbe ọ gbara ọsọ n’ihi Sọl, gbaba n’ọgba.+ 57  Meere m amara, biko, Chineke, meere m amara,+N’ihi na mkpụrụ obi m agbabawo n’ime gị;+Ọ bụkwa na ndò nku gị ka m gbabara ruo mgbe ahụhụ gafere.+   Ana m akpọku Chineke Onye Kasị Elu, bụ́ ezi Chineke onye na-eme ka ahụhụ kwụsị n’ihi m.+   Ọ ga-esi n’eluigwe zite enyemaka wee zọpụta m.+Ọ ga-eme ka onye na-anwa iji ọnụ kpụrụ m nwee mgbagwoju anya.+ Sila.Chineke ga-ezite obiọma* ya na eziokwu ya.+   Mkpụrụ obi m nọ n’etiti ọdụm;+Ọ dịghị ihe m pụrụ ime ma ọ bụghị idina n’etiti ndị na-eripịa mmadụ, n’etiti ụmụ mmadụ,Ndị ezé ha bụ ube na akụ́,+Ndị ire ha bụkwa mma agha dị nkọ.+   Chineke, ka e bulie gị ka ị dị elu karịa eluigwe;+Ka ebube gị dị elu karịa ụwa dum.+   Ha ejiriwo ụgbụ siere ụkwụ m ọnyà;+Mkpụrụ obi m ehuruwo ehuru.+Ha egwuwo olulu n’ihu m;Ha adabawo n’ime ya.+ Sila.   Obi m kwụ chịm, Chineke,+Obi m kwụ chịm.M ga-abụ abụ, meekwa ka ọ bụrụ abụ olu ụtọ.+   Ùgwù m, teta;+Ụbọ akwara, teta; tetakwa, gị une.+M ga-akpọte chi ọbụbọ.   Jehova, m ga-eto gị n’etiti ndị dị iche iche;+M ga-abụku gị abụ olu ụtọ n’etiti mba dị iche iche.+ 10  N’ihi na obiọma gị dị ukwuu ruo n’eluigwe,+Eziokwu gị dịkwa ukwuu ruo na mbara igwe.+ 11  Chineke, ka e bulie gị ka ị dị elu karịa eluigwe;+Ka ebube gị dị elu karịa ụwa dum.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”