Abụ Ọma 56:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Nduru Na-agba Nkịtị n’etiti ndị nọ n’ebe dị anya. Abụ ọma Devid. Miktam. Mgbe ndị Filistia jidere ya n’obodo Gat.+ 56  Chineke, biko, meere m amara, n’ihi na mmadụ efu anwawo iji ọnụ kpụrụ m.+Ọ na-ebuso m agha, na-emegbukwa m ogologo ụbọchị dum.+   Ndị iro m na-anwa iji ọnụ kpụrụ m ogologo ụbọchị dum,+N’ihi na ndị ji mpako na-ebuso m agha dị ọtụtụ.+   N’ụbọchị ọ bụla egwu tụwara m, mụ onwe m ga-atụkwasị gị obi.+   M ga-adabere na Chineke wee too okwu ya.+Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi; m gaghị atụ egwu.+Gịnị ka anụ ahụ́ bụ́ mmadụ ga-eme m?+   Ogologo ụbọchị dum, ha na-emebi ihe niile gbasara m;Ihe niile ha na-eche n’echiche bụ ime m ihe ọjọọ.+   Ha na-awakpo m, gaa zoo,+Ha onwe ha nọ na-ele ebe m na-azọnye ụkwụ,+Mgbe ha chechiri mkpụrụ obi m.+   Jụ ha n’ihi ihe ọjọọ ha na-eme.+Chineke, jiri iwe kwada ndị dị iche iche.+   Gị onwe gị edewo ya n’akwụkwọ na m bụ onye gbara ọsọ.+Gbanye anya mmiri m n’ime karama akpụkpọ gị.+Ọ̀ bụ na ọ dịghị n’akwụkwọ gị?+   N’oge ahụ, ndị iro m ga-alaghachi azụ, n’ụbọchị m ga-akpọku gị;+M maara nke ọma na Chineke nọnyeere m.+ 10  M ga-adabere na Chineke+ wee too okwu ya;M ga-adabere na Jehova wee too okwu ya.+ 11  Ọ bụ Chineke ka m tụkwasịrị obi. Agaghị m atụ egwu.+Gịnị ka mmadụ ga-eme m?+ 12  Chineke, ọ dị nkwa m kwere gị bụ́ ndị m ka ga-emezu.+M ga-achụrụ gị àjà ekele.+ 13  N’ihi na ị napụtawo mkpụrụ obi m n’ọnwụ+Ọ̀ bụ na i meghị ka ụkwụ m ghara ịsụ ngọngọ?+Ka m wee na-ejegharị n’ihu Chineke n’ìhè nke ndị dị ndụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji