Abụ Ọma 55:1-23

Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Maskil. Abụ ọma Devid. 55  Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m;+Ajụkwala ige ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i meere m amara.+   Biko, ṅaa m ntị ma za m.+Nchegbu m emewo ka obi ghara izu m ike,+Ọ dịghị ihe m pụrụ ime ma ọ bụghị inwe nchekasị,   N’ihi ihe onye iro na-ekwu, n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye.+N’ihi na ha na-eme ka ihe ọjọọ bịakwasị m,+Ha jikwa iwe na-ebuso m iro.+   Obi m nọ n’oké ihe mgbu n’ime m,+Ụjọ ọnwụ atụwala m.+   Egwu, ee, ụjọ ejidela m,+Ana m ama jijiji.   Ana m asị: “A sị nnọọ na m nwere nku dị ka nduru!+M ga-efepụ gaa biri n’ebe ọzọ.+   Lee! M ga-efega n’ebe dị anya;+M ga-ebi n’ala ịkpa.+Sila   M ga-eme ngwa ngwa gbaba n’ebe m ga-anọZere ifufe na-efesi ike nakwa oké ifufe.”+   Jehova, biko, mee ka ha nwee mgbagwoju anya, kewaa ire ha,+N’ihi na ahụwo m ime ihe ike na esemokwu n’obodo a.+ 10  Ha na-aga ije n’elu mgbidi ya, na-agba ya gburugburu ehihie na abalị;+Ihe ọjọọ na nsogbu dịkwa n’ime ya.+ 11  Nsogbu jupụtara n’ime ya;Mmegbu na aghụghọ adịghịkwa apụ apụ n’ámá ya.+ 12  N’ihi na ọ bụghị onye iro kọchara m;+A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya.Ọ bụghị onye kpọrọ m oké asị buliri onwe ya elu megide m;+A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m.+ 13  Kama ọ bụ gị, mmadụ efu nke mụ na ya hà,+Onye m maara, bụ́ onye mụ na ya ma,+ 14  N’ihi na mụ na gị bụbu ezigbo enyi;+Anyị na-esobu ìgwè mmadụ abanye n’ụlọ Chineke.+ 15  Ka mbibi bịakwasị ha!+Ka ha gbadaa Shiol ná ndụ;+N’ihi na ihe ọjọọ dị n’etiti ha n’oge ha bụ ndị mbịarambịa.+ 16  Ma, ọ bụ Chineke ka m ga-akpọku;+Ọ bụkwa Jehova ga-azọpụta m.+ 17  N’anyasị, n’ụtụtụ nakwa n’ehihie, naanị ihe m na-eme bụ ichegbu onwe m na ibe ákwá,+Ọ na-anụkwa olu m.+ 18  Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi m n’ọgụ a na-alụso m, ọ ga-emekwa ka mkpụrụ obi m nọrọ n’udo,+N’ihi na ha abịawo n’ìgwè imegide m.+ 19  Chineke ga-anụ olu m wee za ha,+Ee, Onye ahụ nke nọ n’ocheeze kemgbe oge gara aga ga-anụ wee za ha+SilaBụ́ ndị na-adịghị eme mgbanwe,+Ndị na-adịghịkwa atụ egwu Chineke.+ 20  O setịwo aka ya megide ndị ya na ha dị ná mma;+O mebiwo ọgbụgba ndụ ya.+ 21  Okwu ọnụ ya dị nro karịa mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,+Ma obi ya bụ ọgụ ọgụ.+Okwu ya dị nro karịa mmanụ,+Ma ha bụ mma agha a mịpụtara amịpụta.+ 22  Tụkwasị Jehova ibu arọ gị,+Ya onwe ya ga-akwadokwa gị.+Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.+ 23  Ma gị onwe gị, Chineke, ga-eme ka ha gbadaa n’ala ala olulu.+Ma ndị ikpe ọbara mara na ndị aghụghọ agaghị ebiru ọkara ndụ ha.+Ma mụ onwe m ga-atụkwasị gị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji