Abụ Ọma 53:1-6

Ntụziaka e nyere onye nduzi Mehalat.+ Maskil. Abụ ọma Devid. 53  Onye nzuzu asịwo n’obi ya:“Jehova adịghị.”+Ha emewo omume na-eweta mbibi, meekwa arụ n’ajọ omume ha mere;+Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma.+   Ma Chineke si n’eluigwe ledata anya lee ụmụ mmadụ,+Iji hụ ma ọ̀ dị onye nwere nghọta, onye na-achọ Jehova.+   Ha niile alaghachiwo azụ, ha niile rụrụ arụ;+Ọ dịghị onye na-eme ihe ọma,+Ọbụnadị otu onye.   Ọ̀ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla maara ihe n’ime ndị na-eme ihe ọjọọ,+Bụ́ ndị na-eri ndị m dị ka à ga-asị na ha bụ nri?+Ha adịghị akpọku Jehova.+   Oké ụjọ jidere ha n’ebe ahụ,+Bụ́ ebe ụjọ ọ bụla na-adịghị;+N’ihi na Chineke ga-atụsasị ọkpụkpụ onye ọ bụla nke na-ama ụlọikwuu megide gị.+Ị ga-emenye ha ihere, n’ihi na Jehova ajụwo ha.+   A sị nnọọ na nzọpụta dị ukwuu ga-esi na Zayọn bịara Izrel!+Mgbe Jehova ga-akpọlata ndị ya a dọọrọ n’agha,+Ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwee obi ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji