Abụ Ọma 51:1-19

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. Oge Netan onye amụma bịakwutere ya mgbe ya na Bat-shiba+ nwesịrị mmekọahụ. 51  Chineke, biko, meere m amara dị ka obiọma* gị si dị.+Hichapụ mmebi iwu m dị ka ebere gị si dị ukwuu.+   Sachaa m nke ọma ka njehie m pụọ n’ahụ́ m,+Sachapụ m mmehie m.+   N’ihi na mụ onwe m maara mmebi iwu m,+Mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe niile.+   Ọ bụ gị, naanị gị, ka m mehieworo,+Ọ bụkwa ihe dị njọ n’anya gị ka m meworo;+Ya mere, ị bụ onye ezi omume mgbe i kwuru okwu,+O nweghịkwa ihe a ga-eji taa gị ụta mgbe i kpere ikpe.+   Lee! Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu,+Abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.+   Lee! Eziokwu nke dị n’ime obi mmadụ na-atọ gị ụtọ;+Meekwa ka m mata amamihe n’ime obi m.+   Jiri hisop sachapụ m mmehie, ka m wee dị ọcha;+Sachaa m, ka m wee na-acha ọcha karịa snoo.+   Mee ka m ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,+Ka ọkpụkpụ ndị i gwepịara wee ṅụrịa ọṅụ.+   Wepụ ihu gị ná mmehie m,+Hichapụkwa njehie m niile.+ 10  Chineke, biko, mee ka m nwee obi dị ọcha,+Tinyekwa mmụọ ọhụrụ, nke iguzosi ike, n’ime m.+ 11  Achụpụla m n’ihu gị;+Biko, anapụkwala m mmụọ nsọ gị.+ 12  Mee ka m nwetaghachi ọṅụ nke nzọpụta si n’aka gị,+Kwadokwa m site n’ime ka m nwee mmụọ ime ihe.+ 13  M ga-akụziri ndị na-emebi iwu ụzọ gị,+Ka ndị mmehie wee laghachikwute gị.+ 14  Chineke bụ́ Chineke nke nzọpụta m,+ biko, napụta m n’ikpe ọmụma ọbara,+Ka ire m wee jiri ọṅụ na-akọ banyere ezi omume gị.+ 15  Jehova, biko, meghee egbugbere ọnụ m ndị a,+Ka ọnụ m wee kwupụta otuto gị.+ 16  N’ihi na ịchụrụ gị àjà adịghị atọ gị ụtọ—ma ọ́ bụghị ya, m gaara achụ ya;+Àjà a na-esurecha n’ọkụ adịghị atọ gị ụtọ.+ 17  Àjà a na-achụrụ Chineke bụ mmụọ nke nwere mwute;+Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.+ 18  Jiri amara gị meere Zayọn ihe ọma;+Biko, wughachi mgbidi Jeruselem.+ 19  Mgbe ahụ, àjà a chụrụ n’ezi omume ga-atọ gị ụtọ,+Àjà nsure ọkụ na àjà a na-esurecha n’ọkụ;+Mgbe ahụ, a ga-eji ọtụtụ oké ehi chụọ àjà n’elu ebe ịchụàjà gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”