Abụ Ọma 50:1-23
Abụ olu ụtọ Esaf.+
50 Onye Dị Ike,+ Chineke, bụ́ Jehova,+ ekwuwo okwu,+O wee kpọọ ụwa òkù,+Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya.+
2 Chineke si na Zayọn, bụ́ ebe mma ruru gwụ,+ nwuo dị ka ìhè.+
3 Chineke anyị ga-abịa, ọ pụghịkwa ịgbachi nkịtị.+Ọkụ na-eripịa ihe n’ihu ya,+Oké ifufe na-efesikwa ike gburugburu ya.+
4 Ọ na-akpọ eluigwe na ụwa òkù+Ka o wee mee ihe o kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị ya:+
5 “Kpọkọtara m ndị na-eguzosi ike n’ebe m nọ,+Ndị mụ na ha ji àjà gbaa ndụ.”+
6 Eluigwe na-akọ ezi omume ya,+N’ihi na Chineke bụ Onyeikpe.+ Sila.
7 “Ndị m, geenụ ntị, m ga-ekwu okwu,+Izrel, gee ntị, m ga-agba akaebe megide gị.+Abụ m Chineke, bụ́ Chineke gị.+
8 Ọ bụghị n’ihi àjà ndị ị na-achụ ka m ji na-abara gị mba,+Ọ bụghịkwa n’ihi àjà ị na-esurecha n’ọkụ, bụ́ ndị dị n’ihu m mgbe niile.+
9 Agaghị m akpụrụ oké ehi n’ụlọ gị,+Agaghịkwa m akpụrụ mkpi n’ogige anụ ụlọ gị.
10 N’ihi na ọ bụ m nwe anụ ọhịa niile dị n’oké ọhịa,+Bụ́ anụmanụ ndị nọ n’elu otu puku ugwu.+
11 Amaara m anụ ufe niile nke ugwu,+Ìgwè anụmanụ ndị bi n’ọhịa dịkwa n’aka m.+
12 Ọ bụrụ na agụụ agụwa m, agaghị m agwa gị;N’ihi na ọ bụ m nwe elu ala+ na ihe niile dị na ya.+
13 M̀ ga-eri anụ oké ehi ndị dị ike,+M̀ ga-aṅụ ọbara mkpi?+
14 Chụọrọ Chineke ekele dị ka àjà gị,+Nyekwa Onye Kasị Elu ihe ndị i kwere ya ná nkwa;+
15 Kpọkuokwa m n’ụbọchị nsogbu.+M ga-anapụta gị, gị onwe gị ga-enyekwa m otuto.”+
16 Ma Chineke ga-asị onye ajọ omume:+“Ònye nyere gị ikike ịgụpụta ụkpụrụ m,+Na iji ọnụ gị na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ m?+
17 Lee, gị onwe gị kpọrọ ịdọ aka ná ntị asị,+Ị na-elegharakwa okwu m anya.+
18 Mgbe ọ bụla ị hụrụ onye ohi, ihe ya na-amasị gị;+Ọ bụkwa ndị na-akwa iko ka gị na ha na-emekọ ihe.+
19 I meghewo ọnụ na-ekwu ihe ọjọọ,+Ire gị anaghị ahapụ aghụghọ.+
20 Ị na-anọdụ ala na-ekwu okwu ọjọọ banyere nwanne gị,+Ị na-ekwutọkwa nwa nne gị mụrụ.+
21 I mere ihe ndị a, ma m gbachiri nkịtị.+I chere na m ga-adị ka gị.+M ga-abara gị mba,+ m ga-emekwa ka ihe i mere doo gị anya.+
22 Biko, ghọtanụ ihe a, unu ndị na-echefu Chineke,+Ka m wee ghara ịdọri unu n’enweghị onye ga-anapụta unu.+
23 Ọ bụ onye na-achụ ekele dị ka àjà bụ onye na-enye m otuto;+Ma onye na-agbaso ụzọ kwụ ọtọ,M ga-eme ka ọ hụ nzọpụta nke si n’aka Chineke.”+