Abụ Ọma 49:1-20
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora.+ Abụ olu ụtọ.
49 Nụrụnụ, unu ndị niile.Ṅaanụ ntị, unu ndị niile bi n’usoro ihe a,+
2 Unu ihe niile a kpọrọ mmadụ nakwa unu ụmụ mmadụ,Ma ọgaranya ma ogbenye.+
3 Ọnụ m ga-ekwu ihe amamihe dị na ya,+Ihe m na-atụgharị n’uche ga-abụkwa ihe nghọta dị na ya.+
4 M ga-atọ ntị m n’ala ịnụrụ ilu;+M ga-eji ụbọ akwara kọwaa ilu m.+
5 Gịnị mere m ga-eji tụọ egwu n’ụbọchị ihe ọjọọ,+Mgbe njehie nke ndị chọrọ ka m daa gbara m gburugburu?+
6 Ndị na-atụkwasị obi n’ihe onwunwe ha,+Ndị na-anyakwa isi n’ihi na akụnụba ha dị ukwuu,+
7 Ọ dịghị otu n’ime ha pụrụ ịnapụta nwanne ya ma ọlị,+Ọ dịghịkwa nke pụrụ inye Chineke ihe mgbapụta maka ya;
8 (Ihe mgbapụta a ga-akwụ maka mkpụrụ obi ha dị oké ọnụ+Nke na ọ dịghị adị ruo mgbe ebighị ebi)
9 Ka o wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi ma ghara ịbanye n’olulu.+
10 N’ihi na ọ na-ahụ na ọbụna ndị maara ihe na-anwụ,+Ma onye nzuzu ma onye na-adịghị eche echiche na-ala n’iyi,+Ha ga-ahapụkwara ndị ọzọ akụ̀ ha.+
11 Ihe ha chọrọ bụ ka ụlọ ha dịruo mgbe ebighị ebi,+Ka ụlọikwuu ha dịgidekwa site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+Ha agụwo ala ha aha ha.+
12 Ma mmadụ apụghị ịnọgide na-adị ndụ n’agbanyeghị na a na-asọpụrụ ya;+O yiri nnọọ anụ ọhịa ndị e gburu egbu.+
13 Nke a bụ ihe na-eme ndị dara iberiibe,+Na ndị na-eṅomi ha, bụ́ ndị ọnụ ha na-etu na-atọ ụtọ. Sila.
14 Ha ga-aga Shiol dị ka atụrụ e du edu;+Ọnwụ ga-edu ha dị ka atụrụ;+Ndị ziri ezi ga-achị ha n’ụtụtụ,+Ha ga-aka nká;+Onye nke ọ bụla ga-aga Shiol, kama ịga n’ebe obibi dị elu.+
15 Otú ọ dị, Chineke ga-anapụta mkpụrụ obi m n’aka Shiol,+N’ihi na Ọ ga-anabata m. Sila.
16 Atụla egwu ma ọ bụrụ na mmadụ enweta akụnụba,+Ma ọ bụrụ na ebube nke ụlọ ya adịkwuo ukwuu.+
17 N’ihi na ọ pụghị iwere ihe ọ bụla ma ọlị mgbe ọ nwụrụ;+Ebube ya agaghị eso ya gbadaa.+
18 N’ihi na n’oge niile ọ dị ndụ, ọ nọ na-agọzi mkpụrụ obi ya;+(Ndị mmadụ ga-eto gị n’ihi na ị na-eme nke ọma)+
19 N’ikpeazụ, naanị ihe mkpụrụ obi ya na-eme bụ ịgakwuru ọgbọ nna nna ya hà.+Ha agakwaghị ahụ ìhè.+
20 Mmadụ nke na-adịghị aghọta ihe, n’agbanyeghị na a na-asọpụrụ ya,+Yiri nnọọ anụ ọhịa ndị e gburu egbu.+