Abụ Ọma 47:1-9

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ. 47  Kụọnụ aka, unu ndị niile.+Jirinụ ọṅụ tikuo Chineke mkpu mmeri.+   N’ihi na Jehova, bụ́ Onye Kasị Elu, dị egwu,+Eze ukwu nke na-achị ụwa dum.+   Ọ ga-eme ka ndị dị iche iche nọrọ n’okpuru anyị,+Meekwa ka mba dị iche iche nọrọ n’okpuru ụkwụ anyị.+   Ọ ga-ahọtara anyị ihe nketa anyị,+Ya bụ, ihe Jekọb, bụ́ onye ọ hụrụ n’anya, ji anya isi.+ Sila.   Chineke ejiriwo mkpu ọṅụ gbagoo,+Jehova ejiriwokwa ụda opi gbagoo.+   Bụkuonụ Chineke abụ olu ụtọ, bụọnụ abụ olu ụtọ.+Bụkuonụ Eze anyị abụ olu ụtọ, bụọnụ abụ olu ụtọ.   N’ihi na Chineke bụ Eze nke na-achị ụwa dum;+Bụkuonụ ya abụ olu ụtọ, jirinụ ezi uche mee ihe.+   Chineke aghọwo eze nke na-achị mba niile.+Chineke anọrọwo n’ocheeze ya dị nsọ.+   Ndị a ma ama n’etiti ndị dị iche iche ezukọtawo,+Ha na ndị nke Chineke Ebreham.+N’ihi na ọ bụ Chineke nwe ọta niile nke ụwa.+Ọ rịgowo n’ebe dị nnọọ elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji