Abụ Ọma 46:1-11

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora.+ Ọ bụ Ụmụ Agbọghọ ga-abụ ya. Abụ. 46  Chineke bụ ebe mgbaba anyị na ike anyị,+Onye dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.+   Ọ bụ ya mere na anyị agaghị atụ egwu, ọ bụrụgodị na ụwa agbanwee,+Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji daba n’etiti oké osimiri;+   Ọ bụrụgodị na mmiri ya ana-eme mkpọtụ, na-agbọ ụfụfụ,+Ọ bụrụgodị na ugwu dị iche iche amaa jijiji mgbe o bigbọrọ.+ Sila.   E nwere osimiri nke mmiri ya na-eme ka obodo Chineke ṅụrịa ọṅụ,+Bụ́ nnukwu ụlọikwuu kasị nsọ nke Onye Kasị Elu.+   Chineke nọ n’ime obodo ahụ;+ a gaghị eme ka ọ maa jijiji.+Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.+   Mba dị iche iche gbara aghara,+ alaeze dị iche iche makwara jijiji;O mere ka a nụ ụda olu ya, ụwa ewee gbazee.+   Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị;+Chineke Jekọb bụụrụ anyị ebe dị elu e wusiri ike.+ Sila.   Bịanụ, hụ ọrụ dị iche iche nke Jehova,+Otú o si mee ihe ndị na-eju anya n’ụwa.+   Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.+Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube;+Ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.+ 10  “Chịlienụ aka elu, maranụ na abụ m Chineke.+A ga-ebuli m elu n’etiti mba niile,+A ga-ebuli m elu n’ụwa.”+ 11  Jehova nke ụsụụ ndị agha nọnyeere anyị;+Chineke Jekọb bụụrụ anyị ebe dị elu e wusiri ike.+ Sila.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji