Abụ Ọma 45:1-17
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Okooko Lili. Abụ ọma nke ụmụ Kora. Maskil.
Abụ banyere ndị inyom a hụrụ n’anya.
45 Okwu ọma akpaliwo obi m.+Ana m asị: “M na-abụ abụ banyere eze.”+Ka ire m bụrụ mkpịsị+ nke ọkà n’idepụta ihe.+
2 Ị mara mma karịa ụmụ mmadụ.A wụsawo ịma mma n’egbugbere ọnụ gị.+Ọ bụ ya mere Chineke ji gọzie gị ruo mgbe ebighị ebi.+
3 Kee mma agha gị+ n’úkwù, gị onye dị ike,+Keekwa ebube gị na ịma mma gị n’úkwù.+
4 N’ịma mma gị, nwee ihe ịga nke ọma;+Gbaa ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume,+Aka nri gị ga-ezikwa gị ihe dị iche iche dị egwu.+
5 Akụ́ gị dị nkọ ga-abanye n’obi ndị iro eze+—Ndị dị iche iche ga na-ada n’okpuru gị.+
6 Chineke bụ ocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi;+Mkpanaka nke ọbụbụeze gị bụ mkpanaka nke izi ezi.+
7 Ị hụrụ ezi omume n’anya,+ ị kpọkwara ajọ omume asị.+Ọ bụ ya mere Chineke bụ́ Chineke gị+ ji were mmanụ aṅụrị+ tee+ gị karịa ndị ibe gị.+
8 Uwe gị niile na-esi ísì ụtọ dị ka mea na alo na kashịa;Ụda ụbọ akwara nke na-adapụta ná nnukwu obí eze e ji ọdụ́ rụọ+ emewo ka ị ṅụrịa ọṅụ.
9 Ndị inyom+ ndị eze mụrụ so ná ndị inyom ị hụrụ n’anya.Nwunye eze+ eyiriwo ọlaedo nke si Ofa+ guzoro n’aka nri gị.
10 Ada, gee ntị, lee anya, tọọ ntị n’ala;Chefuokwa ndị gị nakwa ụlọ nna gị.+
11 Ịma mma gị ga-agụkwa eze agụụ,N’ihi na ọ bụ onyenwe gị,+Ya mere, gbuoro ya ikpere n’ala.+
12 Ada bụ́ Taya jikwa onyinye bịa+—Ndị bụ́ ọgaranya n’etiti ndị mmadụ ga-eme ka obi gị jụrụ.+
13 Ada eze nke nọ n’ime ụlọ bụ sọ mma;+E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.
14 Ọ ga-eyi uwe a kpara akpa mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.+A na-akpọbatara gị ụmụ agbọghọ ibe ya na-amaghị nwoke bụ́ ndị so ya.
15 A ga-eji obi ụtọ na ọṅụ kpọbata ha;Ha ga-abata n’obí eze.
16 Ụmụ gị ndị ikom+ ga-anọchi nna nna gị hà,+Ị ga-ahọpụta ha ịbụ ndị isi n’ụwa dum.+
17 M ga na-akpọ aha gị n’ọgbọ niile na-abịa.+Ọ bụ ya mere ndị dị iche iche ga-eji too gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.