Abụ Ọma 42:1-11
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Maskil maka ụmụ Kora.+
42 Dị ka mmiri si agụsi nne ele ike,Otú ahụ ka ị na-agụsi mkpụrụ obi m ike, Chineke.+
2 Agụụ Chineke,+ bụ́ Chineke dị ndụ,+ na-agụ mkpụrụ obi m.Olee mgbe m ga-abịa n’ihu Chineke?+
3 Anya mmiri m aghọworo m ihe oriri ma n’ehihie ma n’abalị,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
4 M ga-echeta ihe ndị a, m ga-awụpụkwa mkpụrụ obi m n’ime m dị ka mmiri.+N’ihi na m na-esobu ìgwè mmadụ na-aga,M na-ebutere ha ụzọ jiri nwayọọ nwayọọ na-aga n’ụlọ Chineke,+Anyị na-etiri mkpu ọṅụ na mkpu ekele na-aga,+Dị ka ìgwè ndị na-eme ememme.+
5 Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji agba ghara ghara n’ime m?+Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu.+
6 Chineke m, mkpụrụ obi m adawo mbà n’ime m.+Ọ bụ ya mere m ji na-echeta gị,+Malite n’ala Jọdan nakwa n’elu elu ugwu Hemọn,+Malite n’ugwu nta.+
7 Ogbu mmiri na-akpọ ogbu mmiri òkùMgbe ọ nụrụ ụda mmiri gị nke na-asọda asọda.Oké ebili mmiri gị niile+—N’elu m ka ha gafeworo.+
8 Jehova ga-enye obiọma* ya iwu n’ehihie ka ọ bịakwute m,+Abụ ya ga-adịkwa n’ọnụ m n’abalị;+M ga-ekpeku Chineke mere ka m dị ndụ ekpere.+
9 M ga-agwa Chineke bụ́ nkume m dị elu, sị:+“Gịnị mere i ji chefuo m?+Gịnị mere m ji na-ejegharị ná mwute n’ihi mmegbu si n’aka onye iro?”+
10 Ndị na-ebuso m iro akọchawo m nke ukwuu nke na ọ dị ka à ga-asị na e gwepịara ọkpụkpụ m,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+
11 Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?+Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”