Abụ Ọma 41:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 41  Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+   Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ.+A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa;+Ị pụghịkwa inyefe ya n’aka mkpụrụ obi ndị iro ya.+   Jehova ga-enye ya ume mgbe ọ nọ n’ute ọrịa;+Ị ga-agbanwe ihe ndina ya dum n’oge ọ na-arịa ọrịa.+   Ma mụ onwe m sịrị: “Jehova, biko, meere m amara.+Gwọọ mkpụrụ obi m, n’ihi na emehiewo m gị.”+   Ma ndị iro m na-ekwu ihe ọjọọ banyere m, sị:+“Olee mgbe ọ ga-anwụ, aha ya ewee laa n’iyi?”   Ọ bụrụkwa na mmadụ abịa ịhụ m, ihe o bu n’obi bụ ịghara m ụgha;+Ọ ga-achọta ihe ọjọọ;Ọ ga-apụ; ọ ga-anọ n’èzí na-ekwu ya.+   Ndị niile kpọrọ m asị na-agbakọ izu imegide m;+Ha na-akpara m nkata ihe ọjọọ:+   “E mewo ka ihe na-abaghị n’ihe bịakwasị ya;+Ugbu a o dinaworo ala, ọ gaghị ebili ọzọ.”+   Onye mụ na ya dịkwa ná mma, onye m tụkwasịrị obi,+Onye na-eri nri m,+ atụgharịwo* megide m.+ 10  Ma gị onwe gị, Jehova, biko, meere m amara ma mee ka m bilie ọtọ,+Ka m wee kwụghachi ha.+ 11  Eji m nke a mara na ihe m masịrị gị,N’ihi na onye iro m adịghị eti mkpu ọṅụ na ya emeriwo m.+ 12  Ma ị kwadowo m n’ihi iguzosi ike n’ezi ihe m,+Ị ga-emekwa ka m nọrọ n’ihu gị ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi+Malite na mgbe ebighị ebi ruo ọbụna mgbe ebighị ebi.+Amen na Amen.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ebuliwo ikiri ụkwụ ya.”