Abụ Ọma 4:1-8
Ntụziaka e nyere onye nduzi. A ga-eji ụbọ akwara+ kpọọ ya. Abụ olu ụtọ Devid.
4 Mgbe m kpọkuru gị, biko, za m, Chineke m bụ́ onye ezi omume.+N’oge ahụhụ, meere m ohere sara mbara.Meere m amara,+ nụkwa ekpere m.
2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga na-akpụ ùgwù m+ n’ala,Ebe unu nọ na-ahụ ihe efu n’anya,Ebe unu nọ na-achọ okwu ụgha? Sila.
3 Ya mere, maranụ na Jehova ga-emeso onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ+ mmeso pụrụ iche;Jehova ga-anụ mgbe m kpọkuru ya.+
4 Weenụ iwe, ma unu emehiela.+Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, n’elu ihe ndina unu,+ ma gba nkịtị. Sila.
5 Chụọnụ àjà ezi omume,+Tụkwasịkwanụ Jehova obi.+
6 E nwere ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: “Ònye ga-eme ka anyị hụ ihe ọma?”Jehova, biko, mee ka ìhè si n’ihu gị nwukwasị anyị.+
7 Mee ka obi m ṅụrịa ọṅụ+Karịa ọṅụ ha na-enwe mgbe ọka* na mmanya ọhụrụ ha dị ukwuu.+
8 M ga-edina ala hie ụra n’udo,+N’ihi na ọ bụ naanị gị, Jehova, na-eme ka m nọrọ n’obi iru ala.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.