Abụ Ọma 39:1-13
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn.+ Abụ olu ụtọ Devid.
39 Asịrị m: “M ga-eche ụzọ m nche+Ka m wee ghara iji ire m mehie.+M ga-eji ihe kechie ọnụ m iji chee ya nche, +Mgbe onye ọ bụla bụ́ onye ajọ omume nọ n’ihu m.”+
2 Agbara m nkịtị n’ekwughị okwu;+Emechiri m ọnụ n’ekwughị ihe ọma,+Egosipụtaghịkwa m na ihe na-egbu m mgbu.
3 Obi m wee na-ere ka ọkụ n’ime m;+N’oge m nọ na-asụ ude, ọkụ ahụ nọ na-ere.Eji m ire m kwuo, sị:
4 “Jehova, biko, mee ka m mara ọgwụgwụ m,+Mee ka m mara otú ụbọchị ndụ m ga-aha,+Ka m wee mara otú ndụ m dịruru mkpụmkpụ.+
5 Lee! I mewo ka ụbọchị m dị naanị ole na ole;+Oge ndụ m dị ka ihe efu n’ihu gị.+N’ezie, mmadụ niile bụ naanị ume e kupụrụ ekupụ,+ n’agbanyeghị na ha kwụsiri ike. Sila.
6 N’ezie, mmadụ na-ejegharị dị ka onyinyo.+N’ezie, ha na-eme mkpọtụ na nkịtị.+Mmadụ na-akpakọ akụ̀ n’amaghị onye ọ ga-ahapụrụ ya.+
7 Ugbu a kwa, Jehova, gịnị ka m na-ele anya ya?Olileanya m dị n’ebe ị nọ.+
8 Napụta m ná mmebi iwu m niile.+Emela ka m bụrụ onye onye na-enweghị uche na-akọcha.+
9 M gbachiri nkịtị;+ enweghị m ike imeghe ọnụ m,+N’ihi na gị onwe gị mere ihe.+
10 Wepụ ihe otiti i tiri m.+Nke m agwụla n’ihi mmeso ọjọọ i mesoro m.+
11 Ị gbaziwo mmadụ site n’ịdọ ya aka ná ntị ka ọ ghara ijehie,+Ị na-erichapụkwa ihe ya ndị dị oké ọnụ ahịa dị nnọọ ka nla si eri ihe.+N’ezie, mmadụ niile bụ ume e kupụrụ ekupụ.+ Sila.
12 Jehova, biko, nụrụ ekpere m,Ṅaakwa ntị ná mkpu enyemaka m na-eti.+Agbachila anya mmiri m nkịtị.+N’ihi na abụ m onye mbịarambịa n’ebe ị nọ,+Abụ m onye ọbịa dị ka nna nna m hà niile bụ.+
13 Wepụ anya gị n’ebe m nọ, ka m wee gbasapụ ihu+Tupu mụ anwụọ wee ghara ịnọkwa.”+