Abụ Ọma 36:1-12

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma Devid bụ́ ohu Jehova. 36  Mmebi iwu na-agwa onye ajọ omume okwu n’ime obi ya;+Ọ dịghị atụ egwu Chineke.+   N’ihi na, n’anya ya, ọ dị akọ nke ukwuu+Nke na ọ gaghị achọpụta njehie ya ka o wee kpọ ya asị.+   Okwu ọnụ ya bụ ihe ọjọọ na aghụghọ;+O nwekwaghị nghọta ime ihe ọma.+   Ọ bụ ihe ọjọọ ka ọ na-eme atụmatụ ya n’elu ihe ndina ya.+Ọ na-aga guzoro n’ụzọ ọjọọ.+Ọ dịghị ajụ ihe ọjọọ.+   Jehova, obiọma* gị dị n’eluigwe;+Ikwesị ntụkwasị obi gị dị ruo n’ígwé ojii.+   Ezi omume gị dị ka ugwu Chineke;+Mkpebi ikpe gị bụ oké ogbu mmiri.+Jehova, ị na-azọpụta mmadụ na anụmanụ.+   Chineke, lee ka obiọma gị si dị oké ọnụ ahịa!+Ọ bụkwa na ndò nku gị ka ụmụ mmadụ na-agbaba.+   Ha na-aṅụju ihe kasị mma nke dị n’ụlọ gị afọ;+Ọ bụkwa mmiri nke ihe na-atọ gị ụtọ ka ị na-eme ka ha ṅụọ.+   N’ihi na ọ bụ gị bụ isi iyi nke ndụ;+Ọ bụ ìhè si n’ebe ị nọ ka anyị pụrụ iji hụ ìhè.+ 10  Biko, na-egosi ndị maara gị obiọma gị,+Na-egosikwa ndị obi ha ziri ezi ezi omume gị.+ 11  Ekwela ka ụkwụ mpako zọkwasị m;+Ekwekwala ka aka ndị ajọ omume mee ka m na-awagharị awagharị.+ 12  Ndị na-eme ihe ọjọọ adawo n’ebe ahụ;+A kwadawo ha, ha enweghịkwa ike ibili.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”