Abụ Ọma 35:1-28
Abụ ọma Devid.
35 Jehova, biko, kpechite ọnụ m n’ikpe mụ na ndị na-emegide m nwere;+Buso ha agha, bụ́ ndị na-ebuso m agha.+
2 Buru obere ọta na ọta ukwu,+Biliekwa nyere m aka,+
3 Were ube na anyụike ihu abụọ zute ndị na-achụ m ọsọ.+Sị mkpụrụ obi m: “Abụ m nzọpụta gị.”+
4 Ka ihere mee ndị na-achụ nta mkpụrụ obi m, ka e mechuokwa ha ihu.+Ka e mee ka ndị na-eme atụmatụ ka ọdachi dakwasị m laghachi azụ, ka ihere meekwa ha.+
5 Ka ha dị ka igbogbo ọka nke ifufe na-ebu,+Ka mmụọ ozi Jehova na-achụsasịkwa ha.+
6 Ka ụzọ ha gbaa ọchịchịrị, ka ọ na-amịkwa amị,+Ka mmụọ ozi Jehova na-achụkwa ha ọsọ.
7 N’ihi na ha egwuwo olulu were ụgbụ kpuchie ya ka m daba n’ime ya n’enweghị ihe m mere ha;+Ha gwuuru ya mkpụrụ obi m n’enweghị ihe m mere ha.+
8 Ka mbibi bịakwasị ya na mberede,+Ka ụgbụ o ji sie ọnyà jide ya;+Ka ọ daba n’ime ya laa n’iyi.+
9 Ma ka mkpụrụ obi m ṅụrịa ọṅụ n’ime Jehova;+Ka o nwee obi ụtọ ná nzọpụta ya.+
10 Ka ọkpụkpụ m niile sị:+“Jehova, ònye dị ka gị?+Gị onye na-anapụta onye nọ n’ahụhụ n’aka onye ka ya ike,+Ị na-anapụtakwa onye nọ n’ahụhụ na ogbenye n’aka onye na-apụnara ya ihe.”+
11 Ndị akaebe bụ́ ndị na-eme ihe ike ebiliwo;+Ha na-ajụ m ihe m na-amaghị.+
12 Ha na-eji ihe ọjọọ akwụ m ụgwọ ihe ọma,+Na-eme ka mkpụrụ obi m gbara aka.+
13 Ma mụ onwe m, mgbe ha dara ọrịa, uwe m bụ ákwà iru uju,+Eji m ibu ọnụ mekpaa mkpụrụ obi m ahụ́,+Ekpere m lọghachikwutere m.+
14 Echegburu m onwe m banyere ha dị ka à ga-asị na ha bụ enyi m na nwanne m,+N’ihi ya, ejegharịrị m dị ka onye na-eruru nne ya uju.+Obi dara m mbà n’ihi ịnọ ná mwute.
15 Mgbe m na-ete ụkwụ, ha ṅụrịrị ọṅụ wee gbakọọ;+Ha gbakọrọ imegide m,+Tituo m na mberede;+Ha dọriri m, ha emechighị ọnụ.+
16 Ndị si n’ezi ofufe dapụ bụ́ ndị na-akwa emo iji nweta ntakịrị ihe oriri+Na-ata ikikere ezé megide m.+
17 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga na-ahụ ya?+Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mbibi ha na-eweta,+Napụta otu ihe a m nwere+ n’aka ụmụ ọdụm tojuru etoju.
18 M ga-anọ n’ime ọgbakọ buru ibu too gị;+M ga-eto gị n’etiti ìgwè mmadụ.+
19 Biko, ekwela ka ndị bụ́ ndị iro m n’enweghị ihe m mere ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m;+Ekwela ka ndị kpọrọ m asị na nkịtị tabie anya.+
20 N’ihi na ọ bụghị okwu udo ka ha na-ekwu;+Kama ọ bụ okwu aghụghọ ka ha na-echepụta+Megide ndị nọ jụụ n’ụwa.
21 Ha na-emeghe ọnụ ha megide m.+Ha sịrị: “Ntọọ! Ntọọ! anya anyị ahụwo ya.”+
22 Jehova, ị hụwo ya.+ Agbachila nkịtị.+Jehova, biko, anọla m n’ebe dị anya.+
23 Biko, bilie, teta kpeere m ikpe,+Chineke m, bụ́ Jehova, kpee ikpe m.+
24 Jehova Chineke m, biko, kpee m ikpe dị ka ezi omume gị si dị,+Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
25 Biko, ekwela ka ha sị n’obi ha: “Ntọọ, ọ bụ ihe mkpụrụ obi anyị chọrọ!”+Ekwela ka ha sị: “Anyị elodawo ya.”+
26 Ka ihere mee ha, ka e mechuokwa ha niile ihu,+Bụ́ ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọdachi m.+Ka ndị na-ebuli onwe ha elu megide m+ yiri ihere+ na mweda n’ala dị ka uwe.
27 Ka ndị ezi omume m na-atọ ụtọ tie mkpu ọṅụ ma ṅụrịa ọṅụ,+Ka ha na-ekwu mgbe niile, sị:+“Ka e too Jehova, bụ́ onye udo nke ohu ya na-atọ ụtọ.”+
28 Ka ire m kwupụtakwa ezi omume gị n’olu dị ala,+Ka o kwupụta otuto gị ogologo ụbọchị dum.+