Abụ Ọma 34:1-22
Abụ ọma Devid, mgbe o mere ka onye isi na-adịghị mma+ n’ihu Abimelek, nke mere na ọ chụpụrụ ya, o wee pụọ.
א [Alef]
34 M ga-agọzi Jehova mgbe niile;+Otuto ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile.+
ב [Bet]
2 Mkpụrụ obi m ga-eji Jehova nyaa isi;+Ndị dị umeala n’obi ga-anụ ya wee ṅụrịa ọṅụ.+
ג [Gimel]
3 Soronụ m too Jehova,+Ka anyị niile bulie aha ya elu.+
ד [Dalet]
4 Ajụrụ m Jehova ase, o wee za m,+Ọ napụtakwara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.+
ה [Hee]
5 Ha lekwasịrị anya n’ebe ọ nọ, ihu ha wee na-egbuke egbuke,+Ọ dịghịkwa mgbe a ga-emenye ha ihere n’ihu.+
ז [Zayin]
6 Onye a nke nọ n’ahụhụ kpọkuru Jehova, o wee nụ ya.+Ọ zọpụtakwara ya n’ahụhụ ya niile.+
ח [Het]
7 Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya,+Ọ na-anapụtakwa ha.+
ט [Tet]
8 Detụnụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma;+Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke gbabara n’ime ya.+
י [Yod]
9 Tụọnụ egwu Jehova, unu ndị nsọ ya,+N’ihi na ọ dịghị ihe kọrọ ndị na-atụ egwu ya.+
כ [Kaf]
10 Ụmụ ọdụm tojuru etoju nọ n’enweghị ihe oriri, agụụ jikwa ha;+Ma ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ihe ọma ga-akọ ha.+
ל [Lamed]
11 Bịanụ, ụmụ m, geenụ m ntị;+Ọ bụ egwu Jehova ka m ga-akụziri unu.+
מ [Mem]
12 Ònye ka ndụ na-atọ ụtọ,+Bụ́ onye ọ na-agụ agụụ ịhụ ọtụtụ ụbọchị nke ihe ọma?+
נ [Nun]
13 Chee ire gị nche ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,+Cheekwa egbugbere ọnụ gị nche ka ọ ghara ikwu okwu aghụghọ.+
ס [Samek]
14 Si n’ihe ọjọọ wezụga onwe gị, mee ihe ọma;+Chọọ udo, chụsookwa ya.+
ע [Ayin]
15 Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+Ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.+
פ [Pee]
16 Ihu Jehova na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,+Iji mee ka a ghara ịkpọtụ ha aha n’ụwa.+
צ [Sadee]
17 Ha tiri mkpu, Jehova wee nụ ya,+Ọ napụtakwara ha n’ahụhụ ha niile.+
ק [Kof]
18 Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso;+Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.+
ר [Resh]
19 Ọdachi ndị na-adakwasị onye ezi omume dị ọtụtụ,+Ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.+
ש [Shin]
20 Ọ na-eche ọkpụkpụ niile nke onye ahụ nche;E nweghị otu n’ime ha a gbajiri agbaji.+
ת [Tọọ]
21 Ọdachi ga-egbu onye ajọ omume;+A ga-ama ndị kpọrọ onye ezi omume asị ikpe.+
22 Jehova na-agbapụta mkpụrụ obi ndị ohu ya;+Ọ dịghịkwa onye ọ bụla n’ime ndị gbabara n’ime ya a ga-ama ikpe.+