Abụ Ọma 33:1-22
33 Unu ndị ezi omume, tienụ mkpu ọṅụ n’ihi Jehova.+Ndị ziri ezi kwesịrị inye ya otuto.+
2 Jirinụ ụbọ akwara nye Jehova ekele;+Jirinụ ụbọ nwere akwara iri+ bụkuo ya abụ olu ụtọ.
3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;+Werenụ ike unu niile kpọọ ụbọ akwara, tiekwanụ mkpu ọṅụ.+
4 N’ihi na okwu Jehova ziri ezi,+Ọ na-arụkwa ọrụ ya dum n’ikwesị ntụkwasị obi.+
5 Ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya.+Ụwa jupụtara n’obiọma Jehova.+
6 Ọ bụ site n’okwu Jehova ka e kere eluigwe,+Ọ bụkwa site na mmụọ nke ọnụ ya ka e kere ihe niile dị n’ime ya.+
7 O mere ka mmiri oké osimiri sọkọta ọnụ dị ka mmiri e gbochiri egbochi,+Meekwa ka mmiri na-ekwo ekwo sọkọta ọnụ n’ụlọ nkwakọba ihe.
8 Ka ndị niile bi n’ụwa tụọ egwu Jehova.+Ka ndị niile bi n’elu ala tụọ ya ụjọ.+
9 N’ihi na ya onwe ya kwuru okwu, o wee mee;+Ya onwe ya nyere iwu, o wee dị otú ahụ.+
10 Jehova akpaghasịwo atụmatụ nke mba dị iche iche;+O mebiwo ihe ndị dị iche iche chepụtara.+
11 Nzube Jehova ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi;+Echiche obi ya na-adị site n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
12 Obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya,+Bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.+
13 Jehova si n’eluigwe na-ele anya,+Ọ na-ahụ ụmụ mmadụ niile.+
14 O si n’ebe guzosiri ike o bi+Na-ele ndị niile bi n’elu ụwa anya.
15 Ọ bụ ya kpụrụ obi ha niile;+Ọ na-enyocha ihe niile ha na-eme.+
16 Ọ dịghị eze nke ọ bụ ìgwè ndị agha na-azọpụta;+Ọ bụghịkwa ike dị ukwuu ka a na-eji anapụta dike.+
17 Ịnyịnya bụ ihe efu ma a bịa n’ịzọpụta mmadụ,+Ike dị ukwuu o nwere adịghịkwa emere mmadụ ụzọ mgbapụ.+
18 Lee! Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ,+Bụ́ ndị na-echere obiọma ya,+
19 Iji napụta mkpụrụ obi ha n’aka ọnwụ,+Nakwa iji chebe ha ndụ n’oge ụnwụ.+
20 Mkpụrụ obi anyị anọwo na-atụ anya Jehova.+Ọ bụ onye na-enyere anyị aka na ọta anyị.+
21 N’ihi na ọ bụ n’ime ya ka obi anyị na-aṅụrị ọṅụ;+N’ihi na ọ bụ n’aha nsọ ya ka anyị tụkwasịrị obi.+
22 Jehova, biko, ka obiọma gị dịkwasị anyị,+N’ihi na anyị anọgidewo na-echere gị.+

