Abụ Ọma 32:1-11

Abụ ọma Devid. Maskil. 32  Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya, onye e kpuchiri mmehie ya.+   Obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-adịghị agụkọrọ njehie,+Onye aghụghọ na-adịghịkwa na mmụọ ya.+   Mgbe m gbara nkịtị, ike gwụrụ ọkpụkpụ m n’ihi ude m na-asụ ogologo ụbọchị dum.+   N’ihi na aka gị dị arọ n’ahụ́ m ehihie na abalị.+Ndụ m akpọọla nkụ dị ka ihe anwụ oge ọkọchị mịkpọrọ.+ Sila.   N’ikpeazụ, ekwupụtaara m gị mmehie m, ekpuchighịkwa m njehie m.+Asịrị m: “M ga-ekwupụtara Jehova mmebi iwu m.”+Gị onwe gị gbaghaara m njehie m na mmehie m.+ Sila.   Ọ bụ ya mere onye ọ bụla nke na-eguzosi ike n’ihe ga-eji kpekuo gị ekpere+N’oge a ka pụrụ ịchọta gị.+Ma idei mmiri agaghị emetụ ya.+   Ị bụụrụ m ebe nzuzo; ị ga-echebe m ka ahụhụ ghara ịdakwasị m.+Ị ga-eji mkpu ọṅụ gbaa m gburugburu maka imere m ụzọ mgbapụ.+ Sila.   “M ga-eme ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ ị ga-eso.+M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.+   Unu emela dị ka à ga-asị na unu bụ ịnyịnya ma ọ bụ ịnyịnya ibu na-enweghị uche,+Nke a na-eji eriri ma ọ bụ ụdọ na-achịkwa+Tupu ya abịaruo gị nso.”+ 10  Ihe mgbu onye ajọ omume na-enwe dị ọtụtụ;+Ma onye tụkwasịrị Jehova obi, obiọma* na-agba ya gburugburu.+ 11  Ṅụrịanụ ọṅụ n’ime Jehova, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;+Tienụ mkpu ọṅụ, unu niile ndị obi ha ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”