Abụ Ọma 30:1-12

Abụ olu ụtọ. Abụ e ji rara ụlọ nye.+ Abụ ọma Devid. 30  M ga-eto gị, Jehova, n’ihi na ị dọpụtawo m,+I kweghịkwa ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+   Jehova Chineke m, m tikuru gị maka enyemaka, i wee gwọọ m.+   Jehova, i mewo ka mkpụrụ obi m si na Shiol pụta;+I debewo m ndụ, ka m wee ghara ịgbada n’olulu.+   Unu ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ, bụkuonụ Jehova abụ olu ụtọ,+Nyenụ aha nsọ* ya ekele;+   N’ihi na ọ bụ ruo nwa oge ka ọ na-eweso mmadụ iwe,+Ọ na-emere mmadụ amara n’oge ndụ ya niile.+Ịkwa ákwá pụrụ ịdị n’anyasị,+ ma o ruo n’ụtụtụ, e nwee mkpu ọṅụ.+   Ma mụ onwe m ekwuwo n’oge m tụsaara ahụ́, sị:+“Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka m maa jijiji.”+   Jehova, i mewo ka ugwu m guzosie ike n’ihi amara gị.+I wepụrụ ihu gị; ụjọ wee jide m.+   Jehova, ọ bụ gị ka m nọ na-akpọku;+Ọ bụkwa Jehova ka m nọ na-arịọ ka o meere m amara.+   Olee uru ọbara m bara ma m gbadaa n’olulu?+Ájá ọ̀ ga-eto gị?+ Ọ̀ ga-akọ banyere eziokwu gị?+ 10  Jehova, biko, nụrụ, meere m amara.+Jehova, bụrụ onye na-enyere m aka.+ 11  Ị gbanwewo iru uju m ka ọ bụrụ ịgba egwú;+Ị tọpụwo ákwà iru uju m kere, i kewo m ọṅụ n’úkwù,+ 12  Ka ihe niile dị ebube n’ime m wee bụkuo gị abụ olu ụtọ, gharakwa ịgba nkịtị.+Jehova Chineke m, m ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ihe dị nsọ nke e ji echeta ya.”