Abụ Ọma 29:1-11
Abụ olu ụtọ Devid.
29 Nyenụ Jehova otuto, unu ụmụ nke ndị dị ike,Nyenụ Jehova otuto, kwuonụ na ọ dị ike.+
2 Nyenụ Jehova otuto kwesịrị aha ya.+Yirinụ uwe mara mma nke dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.+
3 Olu Jehova na-ada n’elu mmiri;+Chineke nke dị ebube+ ebigbọwo.+Jehova nọ n’elu ọtụtụ mmiri.+
4 Olu Jehova dị ike;+Olu Jehova dị ebube.+
5 Olu Jehova na-agbaji osisi sida;Ee, Jehova na-agbaji osisi sida ndị dị na Lebanọn irighiri irighiri,+
6 Ọ na-eme ka ha na-awụgharị dị ka nwa ehi,+Ọ na-emekwa ka Lebanọn na Siriọn+ na-awụgharị dị ka ụmụ atụ́.
7 Olu Jehova ji ire ọkụ na-adapụta;+
8 Olu Jehova na-eme ka ala ịkpa maa jijiji,+Jehova na-eme ka ala ịkpa Kedesh+ maa jijiji.
9 Olu Jehova na-eme ka ime malite ime nne ele,+Na-emekwa ka oké ọhịa tọgbọrọ n’efu.+N’ụlọ nsọ ya kwa, onye ọ bụla na-asị: “Ebube!”+
10 Jehova anọdụwo n’elu iju mmiri;+Jehova nọkwa ọdụ dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.+
11 Jehova ga-enye ndị ya ume.+Jehova ga-eji udo gọzie ndị ya.+