Abụ Ọma 28:1-9

Abụ ọma Devid. 28  Jehova, ọ bụ gị ka m na-akpọku.+Oké Nkume m, ajụla ịṅa m ntị,+Ka i wee ghara ịgbachi m nkịtị,+Ka m wee ghara ịdị ka ndị na-agbada n’olulu.+   Nụrụ olu arịrịọ m mgbe m na-etiku gị maka enyemaka,Mgbe m nọ n’ime ime ebe nsọ gị+ gbasaa aka m.+   Adọkpụrụla mụ na ndị ajọ omume nakwa mụ na ndị na-eme ihe ọjọọ,+Ndị na-agwa ndị enyi ha okwu udo+ ma ha bu ihe ọjọọ n’obi.+   Meso ha dị ka omume ha si dị,+Nakwa dị ka ihe ọjọọ ha na-eme si dị.+Meso ha dị ka ọrụ aka ha si dị.+Kwụọ ha ụgwọ dị ka omume ha si dị.+   N’ihi na ha adịghị echebara ihe Jehova na-eme echiche,+Ha adịghịkwa echebara ọrụ aka ya echiche.+Ọ ga-etida ha, ọ gaghị ewuli ha elu.   Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na ọ nụwo olu arịrịọ m.+   Jehova bụ ike m+ na ọta m.+Ọ bụ ya ka m tụkwasịrị obi,+E nyewokwara m aka, nke mere na obi m na-enwe aṅụrị,+M ga-ejikwa abụ m too ya.+   Jehova bụụrụ ndị ya ike,+Ọ bụkwa ebe e wusiri ike nke na-eme ka onye o tere mmanụ nwee nzọpụta dị ukwuu.+   Zọpụta ndị gị, gọziekwa ihe nketa gị;+Zụọ ha dị ka atụrụ ma kuru ha ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji