Abụ Ọma 26:1-12
Abụ ọma Devid.
26 Kpee m ikpe,+ Jehova, n’ihi na mụ onwe m ejewo ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m,+Ọ bụkwa Jehova ka m tụkwasịrị obi, ka m wee ghara ịma jijiji.+
2 Jehova, nyochaa m, leekwa m ule;+Nụchaa akụrụ m na obi m.+
3 N’ihi na obiọma* gị dị n’ihu m,Ejewokwa m ije n’eziokwu gị.+
4 Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ;+Mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.+
5 M kpọrọ ọgbakọ nke ndị na-eme ihe ọjọọ asị,+Mụ na ndị ajọ omume adịghịkwa anọkọ.+
6 M ga-akwọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha,+Jehova, m ga-agakwa ebe ịchụàjà gị gburugburu,+
7 Iji mee ka a nụ ekele m na-enye n’olu dara ụda,+Nakwa iji kọsaa ọrụ gị niile dị ebube.+
8 Jehova, ahụrụ m ụlọ gị nke bụ́ ebe obibi gị n’anya+Nakwa ebe ebube gị bi.+
9 Ewepụkọtala mkpụrụ obi m na ndị mmehie,+Ewepụkọtakwala ndụ m na ndị ikpe ọbara mara,+
10 Bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ,+Ndị aka nri ha jupụtakwara n’iri ngarị.+
11 Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.+Napụta m+ ma meere m amara.+
12 Ụkwụ m ga-eguzo n’ebe dị larịị;+M ga-agọzi Jehova n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”