Abụ Ọma 25:1-22

Abụ ọma Devid. א [Alef] 25  Jehova, ọ bụ gị ka m na-enye mkpụrụ obi m.+ ב [Bet]   Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi;+Ekwela ka ihere mee m.Ekwela ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+ ג [Gimel]   Ọ dịghịkwa onye nwere olileanya n’ebe ị nọ ihere ga-eme.+Ihere ga-eme ndị na-aghọ aghụghọ n’efu.+ ד [Dalet]   Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị;+Zi m ụzọ gị.+ ה [Hee]   Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe,+N’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m.+ ו [Wọọ]Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.+ ז [Zayin]   Jehova, biko, cheta ebere gị+ na obiọma* gị,+N’ihi na ha dị malite na mgbe ebighị ebi.+ ח [Het]   Biko, echetala mmehie m mere n’oge m bụ nwata nakwa nnupụisi m.+Cheta m dị ka obiọma gị si dị,+N’ihi ịdị mma gị, Jehova.+ ט [Tet]   Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume.+Ọ bụ ya mere o ji ezi ndị mmehie ụzọ.+ י [Yod]   Ọ ga-eme ka ndị dị umeala n’obi na-eje ije ná mkpebi ikpe ya,+Ọ ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.+ כ [Kaf] 10  Ụzọ Jehova niile bụ obiọma na eziokwuNye ndị na-edebe ọgbụgba ndụ ya+ na ihe ncheta ya.+ ל [Lamed] 11  N’ihi aha gị, Jehova,+Biko, gbaghara njehie m, n’ihi na ọ dị ukwuu.+ מ [Mem] 12  Olee onye na-atụ egwu Jehova?+Ọ ga-ezi ya ụzọ ọ ga-ahọrọ.+ נ [Nun] 13  Mkpụrụ obi ya ga-ebi n’ịdị mma,+Ụmụ ya ga-enweta ụwa.+ ס [Samek] 14  Ọ bụ ndị na-atụ egwu Jehova ka ya na ha na-enwe mmekọrịta chiri anya,+Ọ bụkwa ya na ha na-agba ndụ, iji mee ka ha mara ọgbụgba ndụ ya.+ ע [Ayin] 15  Anya m dị n’ebe Jehova nọ mgbe niile,+N’ihi na ọ bụ ya na-adọpụta ụkwụ m n’ụgbụ.+ פ [Pee] 16  Chee ihu n’ebe m nọ, meere m amara;+N’ihi na anọ m naanị m, anọkwa m n’ahụhụ.+ צ [Sadee] 17  Ihe na-enye m nsogbu n’obi adịwo ọtụtụ;+Mee ka m si ná nsogbu m nọ na ya pụta.+ ר [Resh] 18  Hụrụ ahụhụ m na nsogbu m,+Gbagharakwa m mmehie m niile.+ 19  Lee ka ndị iro m si dị ọtụtụ,+Ha kpọkwara m asị nke ukwuu.+ ש [Shin] 20  Chee mkpụrụ obi m nche ma napụta m.+Ekwela ka ihere mee m, n’ihi na agbabawo m n’ime gị.+ ת [Tọọ] 21  Ka iguzosi ike n’ezi ihe na ezi omume chebe m,+N’ihi na enwere m olileanya n’ebe ị nọ.+ 22  Chineke, biko, napụta Izrel n’ahụhụ ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”