Abụ Ọma 23:1-6

Abụ olu ụtọ Devid. 23  Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.+Ọ dịghị ihe ga-akọ m.+   Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ịta nri nke ahịhịa jupụtara;+Ọ na-edu m n’ebe izu ike nke mmiri jupụtara.+   Ọ na-eme ka mkpụrụ obi m nwetaghachi ume.+Ọ na-edu m n’ụzọ ezi omume n’ihi aha ya.+   Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,+Agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla,+N’ihi na ị nọnyeere m;+Ọ bụ mkpara gị na mkpanaka gị na-akasi m obi.+   Ị na-edoziri m tebụl n’ihu ndị iro m.+I tewo isi m mmanụ;+Iko m juru n’ọnụ.+   N’ezie, ịdị mma na obiọma* ga na-achụ m ụbọchị niile nke ndụ m;+M ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”