Abụ Ọma 22:1-31
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Nne Ele Isi Ụtụtụ. Abụ olu ụtọ Devid.
22 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?+Gịnị mere i ji nọrọ n’ebe dị anya ghara ịbịa zọpụta m,+Wee ghara ige ntị ná mkpu arịrị m na-eti?+
2 Chineke m, m na-akpọku gị n’ehihie, ma ị dịghị aza;+M na-akpọkukwa gị n’abalị, adịghị m emechi ọnụ.+
3 Ma gị onwe gị dị nsọ,+Onye bi n’etiti otuto Izrel.+
4 Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi;+Ha tụkwasịrị gị obi, i wee na-emere ha ụzọ mgbapụ.+
5 Ọ bụ gị ka ha tikuru,+ ha wee lanahụ;+Gị ka ha tụkwasịrị obi, ihere emeghịkwa ha.+
6 Ma abụ m idide,+ abụghị m mmadụ,Onye ndị mmadụ na-akọcha nakwa onye ndị mmadụ na-eleda anya.+
7 Ndị niile na-ahụ m na-akwa m emo;+Ha na-emeghe ọnụ ha iji kwaa m emo, ha na-efufekwa isi, na-asị:+
8 “O nyefere onwe ya n’aka Jehova.+ Ya meere ya ụzọ mgbapụ!+Ya napụta ya, ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya!”+
9 N’ihi na ọ bụ gị bụ Onye si n’afọ sepụta m,+Onye mere ka obi ruo m ala mgbe m na-aṅụ ara nne m.+
10 E nyefere m n’aka gị malite n’oge m nọ n’akpa nwa;+Ị bụ Chineke m malite n’oge m nọ n’afọ nne m.+
11 Anọla m n’ebe dị anya, n’ihi na nsogbu dị nso,+N’ihi na enweghị m onye inyeaka ọzọ.+
12 Ọtụtụ ụmụ oké ehi agbaala m gburugburu;+Oké ehi ndị dị ike nke Beshan agbawo m gburugburu.+
13 Ha emeghewo ọnụ ha imegide m,+Dị ka ọdụm nke nọ na-adọri anụ ma na-ebigbọ.+
14 A wụpụwo m dị ka mmiri,Ọkpụkpụ m niile ekwokapụsịwo.+Obi m dịzi ka mgbá aṅụ;+Ọ gbazewo n’ime ime afọ m.+
15 Ike adịkwaghị m, adịzi m ka ibe eju,+E mewokwa ka ire m rapara n’ágbụ̀ m;+Ọ bụkwa n’ájá ọnwụ ka ị na-eme ka m nọrọ.+
16 N’ihi na nkịta agbawo m gburugburu;+Nzukọ ndị na-eme ihe ọjọọ agbawo m okirikiri.+Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ dị ka ọdụm.+
17 M nwere ike ịgụ ọkpụkpụ m niile ọnụ.+Ha onwe ha na-ele anya, ha na-ele m anya.+
18 Ha kere uwe m n’etiti onwe ha,+Ha fekwara nza maka uwe m.+
19 Ma gị onwe gị, Jehova, biko, anọla n’ebe dị anya.+Gị onye bụ́ ike m,+ bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
20 Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mma agha,+Napụta otu ihe a m nwere n’aka nkịta;+
21 Biko, zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+Za m ma zọpụta m na mpi atụ́.+
22 M ga-akọsara ụmụnna m+ aha gị;+M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.+
23 Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya!+Unu niile bụ́ mkpụrụ Jekọb, nyenụ ya otuto!+Ka egwu ya jidekwa unu, unu niile bụ́ mkpụrụ Izrel.+
24 N’ihi na ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya,+Ọ dịghịkwa eleghara ya anya;+O wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ,+Mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.+
25 M ga-anọ n’ime ọgbakọ dị ukwuu too gị n’ihi ihe i mere;+M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu ya.+
26 Ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe rijuo afọ;+Ndị na-achọ Jehova ga-eto ya.+Ka obi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+
27 Nsọtụ niile nke ụwa ga-echeta Jehova ma chigharịkwuru ya.+Ezinụlọ niile nke mba dị iche iche ga-akpọkwa isiala n’ihu gị.+
28 N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọbụbụeze,+Ọ bụkwa ya na-achị mba niile.+
29 Ndị ọgaranya niile nọ n’ụwa ga-eri ihe kpọọ isiala;+Ndị niile na-agbada n’ájá ga-ehulata ala n’ihu ya,+Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka mkpụrụ obi nke ya na-adị ndụ.+
30 Ụmụ a ka ga-amụ ga-ejere ya ozi;+A ga-akọrọ ọgbọ ọzọ banyere Jehova.+
31 Ha ga-abịa kọọrọ ndị a ka ga-amụ amụ+Banyere ezi omume ya, ha ga-akọrọ ha na ọ bụ ya mere ihe a.+