Abụ Ọma 19:1-14
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
19 Eluigwe na-akọsa ebube Chineke;+Mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.+
2 Ụbọchị ọ bụla na-eme ka okwu na-asọ ka mmiri,+Abalị ọ bụla na-egosipụta ihe ọmụma.+
3 Ha anaghị ekwu okwu, ha anaghịkwa ekwu ihe ọ bụla;A naghị anụ olu ha.+
4 Eriri ha ji atụ̀ ihe agazuwo ụwa dum,+Olu ha eruwokwa na nsọtụ elu ala.+Chineke amaworo anyanwụ ụlọikwuu n’ime ya,+
5 Ọ dịkwa ka nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ mgbe o si n’ụlọ ndina ya na-apụta;+O ji ọṅụ na-agba n’ụzọ ya dị ka dike nke ji ọṅụ na-agba ọsọ.+
6 Ọ na-esi n’otu nsọtụ nke eluigwe apụta,Ebe ọ na-aga bụkwa na nsọtụ ya nke ọzọ;+Ọ dịghịkwa ihe okpomọkụ ya na-adịghị emetụ.+
7 Iwu+ Jehova zuru okè,+ na-eweghachite mkpụrụ obi.+Ihe ncheta+ Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi,+ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+
8 Iwu+ Jehova ziri ezi,+ na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ;+Ihe Jehova nyere n’iwu+ dị ọcha,+ na-eme ka anya na-enwu gbaa.+
9 Egwu+ Jehova dị ọcha, ọ na-adịru mgbe ebighị ebi.Mkpebi ikpe+ Jehova bụ eziokwu;+ ha niile ziri ezi.+
10 Ha bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo, ee, karịa ọlaedo dị ukwuu a nụchara anụcha;+Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ+ na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụta.+
11 E jiriwokwa ha dọọ ohu gị aka ná ntị;+Idebe ha na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+
12 Ònye pụrụ ịghọta ihe o mehiere n’amaghị ama?+Gbaghara m mmehie m na-amaghị na m mere.+
13 Ekwela ka ohu gị mee omume mpako;+Ekwela ka ọ chịa m.+Mgbe ahụ, m ga-abụ onye zuru ezu,+M ga-abụkwa onye na-emebighị iwu nke ukwuu.
14 Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche+Bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova, Oké Nkume m+ na Onye Mgbapụta m.+