Abụ Ọma 16:1-11
Miktam nke Devid.
16 Chineke, biko, chebe m, n’ihi na agbabawo m n’ime gị.+
2 Asịwo m Jehova: “Ị bụ Jehova; ịdị mma m agaghị abara gị uru,+
3 Kama ọ ga-abara ndị nsọ nọ n’ụwa uru.Ọ bụ naanị n’ebe ha nọ, ya bụ, n’ebe ndị dị ebube nọ, ka m nwere mmasị.”+
4 Ndị ọ na-abụ ha hụ chi ọzọ ha esowe ya na-enwe ọtụtụ ihe mgbu.+M gaghị awụpụ àjà ihe ọṅụṅụ ha ji ọbara achụ,+Aha ha agaghịkwa adị n’ọnụ m.+
5 Jehova bụ òkè e kenyere m+ nakwa iko e nyere m.+Ị na-ejidesiri m òkè m ike.
6 Ihe ị tụrụ atụ̀ inye m ka ọ bụrụ ihe nketa m dị mma.+N’ezie, ihe m nwetara dị m mma.
7 M ga-agọzi Jehova, bụ́ onye nyeworo m ndụmọdụ.+N’ezie, akụrụ m agbaziwo m n’abalị.+
8 Emewo m ka Jehova nọrọ n’ihu m mgbe niile.+N’ihi na ọ nọ m n’aka nri, a gaghị eme ka m maa jijiji.+
9 Ya mere, obi m na-aṅụrị ọṅụ, ihe niile dị ebube n’ime m na-enwe aṅụrị.+Anụ ahụ́ m ga-ezukwa ike.+
10 N’ihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Shiol.+Ị gaghị ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ banye n’olulu.+
11 Ị ga-eme ka m mara ụzọ ndụ.+Ịṅụrịju ọṅụ afọ dị n’ihu gị;+Ịdị mma dị n’aka nri gị ruo mgbe ebighị ebi.+