Abụ Ọma 148:1-14

148  Toonụ Jaa!+Sinụ n’eluigwe too Jehova,+Toonụ ya n’ebe dị elu.+   Toonụ ya, unu ndị mmụọ ozi ya niile.+Toonụ ya, unu ụsụụ ndị agha ya dum.+   Toonụ ya, unu anyanwụ na ọnwa.+Toonụ ya, unu kpakpando niile na-enye ìhè.+   Toonụ ya, unu eluigwe nke eluigwe,+Nakwa mmiri nke dị n’eluigwe.+   Ka ha too aha Jehova;+N’ihi na ọ bụ ya nyere iwu, e wee kee ha.+   Ọ na-emekwa ka ha dịruo mgbe ebighị ebi, ruo mgbe niile ebighị ebi.+O nyewo ụkpụrụ ya, ọ gaghịkwa agabiga agabiga.+   Sinụ n’ụwa too Jehova,+Unu nnukwu anụ mmiri na unu ogbu mmiri niile,+   Unu ọkụ na akụ́ mmiri ígwé, snoo na oké anwụrụ ọkụ,+Unu oké ifufe nke na-emezu okwu ya,+   Unu ugwu ukwu na ugwu nta niile,+Unu osisi na-amị mkpụrụ na osisi sida niile,+ 10  Unu anụ ọhịa na anụ ụlọ niile,+Unu ihe na-akpụ akpụ na nnụnụ nwere nku,+ 11  Unu ndị eze ụwa+ nakwa unu mba niile,Unu ndị isi+ nakwa unu ndị ikpe niile nke ụwa,+ 12  Unu ụmụ+ okorobịa na ụmụ agbọghọ,+Unu ndị agadi+ nakwa ụmụ okoro.+ 13  Ka ha too aha Jehova,+N’ihi na ọ bụ naanị aha ya dị elu nke ukwuu.+Ebube ya dịkwa elu karịa ụwa na eluigwe.+ 14  Ọ ga-eme ka mpi ndị ya dị elu,+Meekwa ka otuto nke ndị niile na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ dị elu,+Ya bụ, nke ụmụ Izrel, bụ́ ndị nọ ya nso.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji