Abụ Ọma 147:1-20

147  Toonụ Jaa,+N’ihi na ọ dị mma ịbụku Chineke anyị abụ olu ụtọ;+N’ihi na ọ dị ụtọ—e kwesịrị ito ya.+   Jehova na-ewu Jeruselem;+Ọ na-achịkọta ndị Izrel a chụsara achụsa.+   Ọ na-agwọ+ ndị e tiwara obi,+Ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.+   Ọ na-agụ kpakpando niile ọnụ;+Ọ na-akpọ ha niile aha ha.+   Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;+A pụghị ịkọcha akụkọ banyere nghọta ya.+   Jehova na-enyere ndị dị umeala n’obi aka;+Ọ na-ewedaru ndị ajọ omume ala.+   Bụkuonụ Jehova abụ ekele;+Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Chineke anyị abụ olu ụtọ,+   Onye ji ígwé ojii kpuchie eluigwe,+Onye na-eme ka mmiri zooro ụwa,+Onye na-eme ka ugwu dị iche iche puo ahịhịa ndụ.+   Ọ na-enye anụmanụ ihe oriri ha,+Na-enyekwa ụmụ ugoloọma na-ebeku ya ihe oriri.+ 10  Ọ bụghị n’ike ịnyịnya ka o nwere mmasị,+Ọ bụghịkwa n’ụkwụ mmadụ ka o nwere mmasị.+ 11  Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ndị na-atụ egwu ya,+Ee, ndị na-echere obiọma* ya.+ 12  Jeruselem, jaa Jehova mma.+Zayọn, too Chineke gị.+ 13  N’ihi na o mewo ka ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá gị sie ike;Ọ gọziwo ụmụ gị nọ n’ime gị.+ 14  Ọ na-eme ka udo dị n’ókèala gị;+Ọ na-eji ọka wit kasị mma eme ka afọ ju gị.+ 15  Ọ na-ezite okwu ya n’ụwa;+Okwu ya na-agbakwa oké ọsọ. 16  Ọ na-enye snoo dị ka ajị anụ;+Ọ na-aghasasị mkpụrụ mmiri dị ka ntụ.+ 17  Ọ na-atụpụ mkpụrụ mmiri dị ka ibé achịcha.Ònye pụrụ idi oyi ya?+ 18  Ọ na-ezipụ okwu ya,+ wee gbazee ha.Ọ na-eme ka ifufe ya fee;+Mmiri ewee na-asọ. 19  Ọ na-agwa Jekọb okwu ya,+Na-agwakwa Izrel ụkpụrụ ya+ na mkpebi ikpe ya.+ 20  Ọ dịghị mba ọ bụla ọzọ o meere otú ahụ;+Ha amaghịkwa mkpebi ikpe ya.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”