Abụ Ọma 146:1-10

146  Toonụ Jaa!+Mkpụrụ obi m, too Jehova.+   M ga-eto Jehova ụbọchị ndụ m niile.+M ga-abụku Chineke m abụ olu ụtọ ruo oge niile m dị ndụ.+   Unu atụkwasịla ndị a ma ama obi,+Unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya.+   Mmụọ ya na-apụ,+ o wee laghachi n’ala o si pụta;+N’ụbọchị ahụ, echiche ya na-ala n’iyi.+   Obi ụtọ na-adịrị onye nwere Chineke nke Jekọb dị ka onye na-enyere ya aka,+Onye olileanya ya dị n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ,+   Bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa,+Oké osimiri na ihe niile dị n’ime ha,+Onye bụ́ onye eziokwu ruo mgbe ebighị ebi,+   Onye na-eme ka ndị a na-erigbu erigbu nweta ikpe ziri ezi,+Onye na-enye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.+Jehova na-atọhapụ ndị e kere agbụ.+   Jehova na-emeghe anya ndị ìsì;+Jehova na-ekulite ndị huuru ehuru;+Jehova hụrụ ndị ezi omume n’anya.+   Jehova na-eche ndị mbịarambịa nche;+Ọ na-enyere nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ aka,+Ma ọ na-eme ka ụzọ+ ndị ajọ omume gbagọọ agbagọ.+ 10  Jehova ga-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi,+Zayọn, Chineke gị ga-abụkwa eze site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji