Abụ Ọma 143:1-12

Abụ olu ụtọ Devid. 143  Jehova, biko, nụrụ ekpere m;+Ṅaa ntị n’arịrịọ m.+Jiri ikwesị ntụkwasị obi gị za m n’ezi omume gị.+   Emela ka gị na ohu gị baa n’ikpe;+N’ihi na ọ dịghị onye dị ndụ nke pụrụ ịbụ onye ezi omume n’ihu gị.+   N’ihi na onye iro achụwo mkpụrụ obi m ọsọ;+O gwepịaruwo mkpụrụ obi m ala.+O mewo ka m biri n’ebe gbara ọchịchịrị dị ka ndị nwụrụ anwụ kemgbe a na-amaghị ama.+   Ike na-agwụkwa mmụọ m+ n’ime m;Obi m adawo mbà n’ime m+.   Echetawo m oge dị anya gara aga;+Atụgharịwo m uche n’ọrụ gị dum;+Eji m obi m dum na-echebara ọrụ aka gị echiche.+   Agbasapụworo m gị aka m;+Agụụ gị na-agụ mkpụrụ obi m otú agụụ mmiri si agụ ala kpọrọ nkụ.+ Sila.   Jehova, biko, mee ngwa za m.+Ike agwụla mmụọ m.+Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ,+Ma ọ́ bụghị ya, m ga-adị ka ndị na-agbada n’olulu.+   Mee ka m nụrụ obiọma* gị n’ụtụtụ,+N’ihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi.+Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ije ije na ya,+N’ihi na ọ bụ gị ka m nyere mkpụrụ obi m.+   Jehova, biko, napụta m n’aka ndị iro m.+Agbabawo m n’ime gị.+ 10  Kụziere m ime uche gị,+N’ihi na ị bụ Chineke m.+Mmụọ gị dị mma;+Ka ọ na-edu m n’ala ezi omume.+ 11  Jehova, biko, chebe m ndụ+ n’ihi aha gị.+Napụta mkpụrụ obi m n’ahụhụ+ n’ihi ezi omume gị.+ 12  N’obiọma gị, mechie ọnụ ndị iro m;+Bibiekwa ndị niile na-ebuso mkpụrụ obi m iro,+N’ihi na abụ m ohu gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”