Abụ Ọma 141:1-10
Abụ olu ụtọ Devid.
141 Jehova, akpọkuwo m gị.+Biko, bịakwute m ngwa ngwa.+Nụrụ olu m mgbe m kpọkuru gị.+
2 Ka ekpere m bụrụ ihe a kwadebere n’ihu gị+ dị ka ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ,+Ka mgbasa m na-agbasa ọbụ aka m dịrị ka àjà ọka* a na-achụ ná mgbede.+
3 Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche;+Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+
4 Ekwela ka obi m dịrị n’ihe ọjọọ ọ bụla,+Ka m wee ghara iso ndị na-eme ihe ọjọọ+Na-eme arụ site n’ime omume ọjọọ,+Ka m wee ghara iri nri ụtọ ha.+
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+
6 E siwo n’akụkụ nkume dị elu tụda ndị ikpe ha,+Ma ha anụwo ihe m kwuru, mara na ọ dị mma.+
7 Dị ka mgbe mmadụ warisịrị nkụ wụsa n’ala,Otú a ka a ghasaworo ọkpụkpụ anyị n’ọnụ Shiol.+
8 Otú ọ dị, anya m dị n’ebe ị nọ,+ Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị.+Agbabawo m n’ime gị.+Awụpụla mkpụrụ obi m dị ka mmiri.+
9 Chebe m ka m ghara ịdaba n’ọnyà ha siiri m,+Ka m gharakwa ịdaba n’ọnyà ndị na-eme ihe ọjọọ siri.+
10 Ndị ajọ omume ga-adabakọta n’ụgbụ ha,+Ma mụ onwe m ga-agafere.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”