Abụ Ọma 140:1-13
Maka onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
140 Jehova, biko, napụta m n’aka ndị ọjọọ;+Chebe m ka m ghara ịdaba n’aka onye na-eme ihe ike,+
2 Ndị kpara nkata ihe ọjọọ n’obi ha,+Bụ́ ndị na-awakpo m ogologo ụbọchị dum dị ka à ga-asị na anyị na-alụ agha.+
3 Ha amụwo ire ha amụ dị ka ire agwọ;+Elò nke ajụala nwere mpi dị n’okpuru egbugbere ọnụ ha.+ Sila.
4 Jehova, biko, chebe m ka m ghara ịdaba n’aka onye ajọ omume;+Chebe m ka m ghara ịdaba ọbụna n’aka onye na-eme ihe ike,+Ndị kpaworo nkata ime ka m zọhie ụkwụ.+
5 Ndị na-ebuli onwe ha elu esiworo m ọnyà;+Ha atụsasịwokwa ụdọ dị ka ụgbụ n’akụkụ ụzọ.+Ha esiworo m ọnyà.+ Sila.
6 Asịwo m Jehova: “Ị bụ Chineke m.+Jehova, biko, ṅaa ntị n’olu arịrịọ m.”+
7 Jehova bụ́ Ọkaakaa Onyenwe anyị,+ ike nke nzọpụta m,+I kpuchiwo isi m n’ụbọchị agha.+
8 Jehova, biko, enyela onye ajọ omume ihe na-agụ ya.+Akwadola nkata ọ na-akpa, ka ha wee ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila.
9 Ka nsogbu egbugbere ọnụ nke ndị gbara m gburugburu kpatara+Zuo ha ahụ́.+
10 Ka a wụkwasị ha icheku ọkụ.+Ka a kwaba ha n’ọkụ,+ n’olulu mmiri, ka ha wee ghara ibilite.+
11 Onye na-ekwuwa ọnụ—ka ọ ghara iguzosi ike n’ụwa.+Onye na-eme ihe ike—ka ihe ọjọọ nweta ya ma tie ya ihe otiti ugboro ugboro.+
12 Amaara m nke ọma na Jehova ga-eme+Ka onye nọ n’ahụhụ nweta ihe ruuru ya, ka ndị ogbenye nweta ikpe ziri ezi.+
13 N’ezie, ndị ezi omume ga-enye aha gị ekele;+Ndị ziri ezi ga-ebi n’ihu gị.+