Abụ Ọma 138:1-8

Abụ ọma Devid. 138  M ga-eji obi m dum too gị.+M ga-abụku gị abụ olu ụtọ n’ihu chi ọzọ dị iche iche.+   M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala,+M ga-etokwa aha gị,+N’ihi obiọma* gị+ nakwa n’ihi eziokwu gị.+N’ihi na i mewo ka okwu gị dị ebube+ karịa ọbụna aha gị dum.+   N’ụbọchị m kpọkuru gị, gị onwe gị zara m;+I wee mee ka obi sie mkpụrụ obi m ike, meekwa ka ọ dị ike.+   Jehova, ndị eze niile nke ụwa ga-eto gị,+N’ihi na ha ga-anụworị okwu si n’ọnụ gị.   Ha ga-abụkwa abụ banyere ụzọ Jehova,+N’ihi na ebube Jehova dị ukwuu.+   N’ihi na Jehova dị elu, ma ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi;+Ma ọ na-anọ onye na-ebuli onwe ya elu n’ebe dị anya.+   Ọ bụrụ na mụ ejee ije n’ime ahụhụ, ị ga-echebe m ndụ.+N’ihi iwe ndị iro m, ị ga-amatị aka gị,+Aka nri gị ga-azọpụtakwa m.+   Jehova ga-emezu ihe o zubere banyere m.+Jehova, obiọma gị na-adịru mgbe ebighị ebi.+Ahapụla ọrụ aka gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”