Abụ Ọma 137:1-9
137 N’akụkụ osimiri Babịlọn+—n’ebe ahụ ka anyị nọdụrụ ala.+Anyị kwakwara ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.+
2 N’elu osisi pọpla+ ndị dị n’ala ahụKa anyị konyere ụbọ akwara anyị.+
3 N’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị dọọrọ anyị n’agha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,+Ndị na-akwa anyị emo gwakwara anyị ka anyị mee ha obi ụtọ, sị:+“Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zayọn.”+
4 Olee otú anyị ga-esi bụọ abụ Jehova+N’ala ọzọ?+
5 Ọ bụrụ na mụ echefuo gị, Jeruselem,+Ka aka nri m chefuo nkà ya.
6 Ka ire m rapara n’okpo ọnụ m,+Ma ọ bụrụ na mụ echetaghị gị,+Ma ọ bụrụ na mụ emeghị ka Jeruselem dị eluKarịa ihe kasị enye m ọṅụ.+
7 Jehova, biko, cheta+ ihe ụmụ Idọm+ mere n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị Jeruselem,+Ha nọ na-asị: “Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!”+
8 Ada bụ́ Babịlọn, onye a ga-ebukọrọ ihe ya,+Obi ụtọ ga-adịrị onye ga-akwụ gị ụgwọ+Mmeso i mesoro anyị.+
9 Obi ụtọ ga-adịrị onye ga-ejide ụmụ gịKụrie ha na nkume dị elu.+