Abụ Ọma 135:1-21

135  Toonụ Jaa!+Toonụ aha Jehova,+Nyenụ ya otuto, unu ndị ohu Jehova,+   Unu ndị na-eguzo n’ụlọ Jehova,+N’ogige ụlọ Chineke anyị.+   Toonụ Jaa, n’ihi na Jehova dị mma.+Bụkuonụ aha ya abụ olu ụtọ, n’ihi na ọ dị mma.+   N’ihi na Jaa ahọrọwo Jekọb ka ọ bụrụ nke ya,+Họrọkwa Izrel ka ọ bụrụ ihe onwunwe ya pụrụ iche.+   N’ihi na mụ onwe m maara na Jehova dị ukwuu,+Onyenwe anyị karịrị chi niile ọzọ.+   Jehova emewo ihe niile masịrị ya+N’eluigwe na n’ụwa, n’oké osimiri na n’ogbu mmiri niile.+   Ọ na-eme ka alụlụụ si na nsọtụ ụwa na-akwụgo;+O meworo mmiri ozuzo oghere;+Ọ na-eme ka ifufe si n’ụlọ nkwakọba ihe ya pụta,+   Onye gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+Ma mmadụ ma anụmanụ.+   O mere ihe ịrịba ama, rụọkwa ọrụ ebube n’ime gị, gị Ijipt,+N’ahụ́ Fero na n’ahụ́ ndị niile na-ejere ya ozi;+ 10  Onye bibiri ọtụtụ mba,+Gbuokwa ndị eze dị ike,+ 11  Ọbụna Saịhọn eze ndị Amọraịt+Na Ọg eze Beshan,+Bibiekwa alaeze niile nke Kenan, 12  Onye weere ala ha nye ndị ya ka ọ bụrụ ihe nketa ha,+Ka ọ bụụrụ Izrel bụ́ ndị ya ihe nketa. 13  Jehova, aha gị na-adịru mgbe ebighị ebi.+Jehova, ihe ncheta gị na-adị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.+ 14  N’ihi na Jehova ga-ekpechite ọnụ ndị ya,+Ọ ga-enwekwa ọmịiko n’ebe ndị ohu ya nọ.+ 15  Arụsị mba niile bụ ọlaọcha na ọlaedo,+Ọrụ aka mmadụ.+ 16  Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu ihe ọ bụla;+Ha nwere anya, ma ha apụghị ịhụ ihe ọ bụla;+ 17  Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe ọ bụla.+Ọ dịghịkwa mmụọ dị n’ọnụ ha.+ 18  Ndị na-eme ha ga-adị nnọọ ka ha,+Ee, onye ọ bụla nke tụkwasịrị ha obi.+ 19  Ụlọ Izrel, gọzienụ Jehova.+Ụlọ Erọn, gọzienụ Jehova.+ 20  Ụlọ Livaị, gọzienụ Jehova.+Unu ndị na-atụ egwu Jehova, gọzienụ Jehova.+ 21  Ka e si na Zayọn gọzie Jehova,+Bụ́ onye bi na Jeruselem.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji