Abụ Ọma 130:1-8
Abụ Nrịgo.
130 Jehova, anọ m n’ime ogbu mmiri kpọkuo gị.+
2 Jehova, biko, nụrụ olu m.+Ka ntị gị nụkwa olu arịrịọ m.+
3 A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele,+ Jaa,Jehova, ònye pụrụ iguzo?+
4 N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị,+Ka e wee na-atụ egwu gị.+
5 Atụwo m anya enyemaka gị, Jehova, mkpụrụ obi m atụwo anya enyemaka gị,+Echerewo m okwu gị.+
6 Mkpụrụ obi m echerewo Jehova+Karịa ka ndị nche na-eche ka chi bọọ,+Ndị na-eche ka chi bọọ.+
7 Ka Izrel na-echere Jehova.+N’ihi na Jehova nwere obiọma,*+Mgbapụta dị ukwuu dịkwa n’aka ya.+
8 Ọ ga-agbapụtakwa Izrel ná njehie ya niile.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”