Abụ Ọma 13:1-6
Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid.
13 Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m?+ Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+Ruo ole mgbe ka ị ga-ewepụ ihu gị n’ebe m nọ?+
2 Ruo ole mgbe ka mkpụrụ obi m ga na-agba mgba,Ruo ole mgbe ka obi m ga na-eru uju ogologo ụbọchị dum?Ruo ole mgbe ka onye iro m ga na-aka m ike?+
3 Lee m anya; za m, Jehova Chineke m.Mee ka anya m na-enwu gbaa,+ ka m ghara ịda n’ụra ọnwụ,+
4 Ka onye iro m wee ghara ịsị: “Emeriela m ya!”Ka ndị na-emegide m wee ghara ịṅụrị ọṅụ n’ihi na e mere ka m na-adagharị adagharị.+
5 Ma mụ onwe m, n’obiọma* gị ka m tụkwasịrị obi;+Ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị.+
6 M ga-abụku Jehova abụ, n’ihi na o mesowo m mmeso ọma.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”