Abụ Ọma 129:1-8
Abụ Nrịgo.
129 “Ha ebusowo m iro ruo ogologo oge malite mgbe m bụ nwata,”+Ka Izrel kwuo, sị,+
2 “Ha ebusowo m iro ruo ogologo oge malite mgbe m bụ nwata;+Ma ha emerighị m.+
3 Ndị na-akọ ihe n’ubi akọwo ihe n’elu azụ m;+Ha emewo ka ebe ha kọrọ akọ dịkwuo ogologo.”
4 Jehova bụ onye ezi omume.+O gbubisịwo ụdọ ndị ajọ omume.+
5 Ihere ga-eme ndị niile kpọrọ Zayọn asị,+Ha ewee gbaghachi azụ.+
6 Ha ga-adị ka ahịhịa ndụ nke puru n’elu ụlọ,+Bụ́ nke na-akpọnwụ tupu e fopụ ya,+
7 Nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị ekpoju aka,+Onye ọ bụla nke na-achịkọta okporo ọka adịghịkwa ekpoju ya n’obi uwe ya.
8 Ndị na-agafe agafe adịghịkwa ekwu, sị:“Ka ngọzi Jehova dịrị unu.+Anyị ejiriwo aha Jehova gọzie unu.”+