Abụ Ọma 128:1-6
Abụ Nrịgo.
128 Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova,+Onye na-eje ije n’ụzọ ya.+
2 N’ihi na ị ga-eri ihe aka gị rụpụtara.+Obi ụtọ ga-adịrị gị, ihe ga-agazikwara gị.+
3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ+N’ime ime ụlọ gị.Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv+ gburugburu tebụl gị.
4 Lee! Otú ahụ ka a ga-esi gọzie dimkpa+Nke na-atụ egwu Jehova.+
5 Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.+Hụkwa ọganihu Jeruselem ụbọchị niile nke ndụ gị,+
6 Hụkwa ụmụ ụmụ gị.+Ka udo dịrị Izrel.+