Abụ Ọma 127:1-5

Abụ Nrịgo. Abụ ọma Sọlọmọn. 127  Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ,+Ọ bụ n’efu ka ndị na-ewu ya na-arụsi ọrụ ike na ya.+Ọ bụrụ na Jehova echeghị obodo,+Ọ bụ n’efu ka onye nche na-amụ anya.+   Ọ bụ n’efu ka unu na-ebili n’isi ụtụtụ,+Na-anọdụ ala n’abalị,+Na-eri nri n’ihe mgbu.+Ọ bụ otú a ka o si eme ka onye ọ hụrụ n’anya rahụ ụra.+   Lee! Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova;+Mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ.+   Dị ka akụ́ nke dị n’aka dike,+Otú ahụ ka ụmụ a mụrụ n’okorobịa dị.+   Obi ụtọ na-adịrị dimkpa nke ji ha kpojuo+ akpa akụ́ ya.Ihere agaghị eme ha,+N’ihi na ha na ndị iro ha ga na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ ámá.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji