Abụ Ọma 126:1-6
Abụ Nrịgo.
126 Mgbe Jehova kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha,+Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ.+
2 Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ,+Mkpu ọṅụ jupụtakwara n’ire anyị.+Ha wee kwuwe n’etiti mba niile n’oge ahụ, sị:+“Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere ha.”+
3 Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere anyị.+Anyị na-aṅụrị ọṅụ.+
4 Jehova, biko, kpọlata ndị ala anyị a dọọrọ n’agha,+Dị ka ọwa mmiri ndị dị na Negeb.+
5 Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ+Ga-eji mkpu ọṅụ wee ihe ubi.+
6 Onye bu akpa nke mkpụrụ ọghịgha juru wee na-aga,+Ọbụna na-akwa ákwá,+Aghaghị iji mkpu ọṅụ+Buru ùkwù ọka* na-alọta.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.